Soludo Ejirila ₦15000 Gbaara Ndị Ọrụ Oyibo Anambra Ekeresimesi

Dec 22, 2022 - 14:13
 0
Soludo Ejirila ₦15000 Gbaara Ndị Ọrụ Oyibo Anambra Ekeresimesi

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ọrụ oyibo na steeti Anambra nọ̀rọ̀ ụbọchị Tuzdee wee tiwaa mkpu ọṅụ, dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo kwupụtàrà ihe dị icheiche ọ ga-eme iji kwàlite ọdịmma ha na arụmọrụ ha.

Nke a bụ isi sekpụ ntị na mmemme imerùbè Ụbọchị Ndị Ọrụ Oyibo nke afọ 2022, bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ, bụ ‘Jerome Udorji Secretariat’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ mmemme omenafọ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị ọrụ oyibo sitere ngalaba dị icheiche n'Anambra, tinyéré ndị ọchịchị na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche steeti ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Soludo kwupụtàrà na ọchịchị ya ga-eji puku naịra iri na ise wee gbaara ndị ọrụ niile nọ na steeti ahụ ekeresimesi n'otu n'otu iji sị ha daalụ maka ọrụ ha n'afọ a.

Dịka a ga-asị na nke ahụ ezughị̀, ya bụ Gọvanọ nọkwàrà ebe ahụ wee kwe nkwà na ọ ga-atụkwàsara onye ọrụ oyibo ọbụla n'ime steeti ahụ pasenti iri n'elu ụgwọ ọnwa ya, malite n'ọnwa Jenụwarị afọ na-abịa abịa.

Gọvanọ Soludo kèlèrè ndị ọrụ oyibo ahụ maka etu ha siri wee tụnyere ya akwụkwọ nke ukwu n'afọ gara, o wee turu ugo dịka Gọvanọ steeti ahụ. O kelèkwàra ha maka nkwàdó dị icheiche ha na-enye ọchịchị ya, nke mere ka ọrụ ya na-aga nke ọma kemgbe ọnwa iteghete gara aga o jiri banye n'ọkwa, bụkwa nke o kwuru na ọ na-enye aka na mmezupụ̀ta nke atụmatụ ọrụ dị icheiche o ji n'aka na steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ego ahụ o kwèrè nkwà itinyere ha bụ otu ụzọ isi kwụghachi ha maka ezi arụmọrụ ha, ya na ihe agbamume nyere ha, iji rụsie ọrụ ike karịa ka a tụrụ anya.

Dịka ọ na-akpọpụ̀tasị ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtagoro kemgbe ọnwa olenole ọ banyere n'ọkwa; Gọvanọ Soludo kwezịrị nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà ịga n'ihu na-emezupute nkwà dị icheiche o kwèrè Ndị Anambra; ọbụna dịka o kwèrè nkwà na ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba ga-alaghàchikwa azụ na steeti ahụ n'oge adịghị anya.

O kwuru na ịkwalite ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ oyibo steeti ahụ sò n'otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ọchịchị ya ga-aga n'ihu na-elebà anya ma ọ dịka Gọvanọ Anambra, n'ihi na ya onwe ya ghọtara ụdị uru ndị ọrụ oyibo bàrà ná mmepe na ọganihu obodo maọbụ steeti ọbụla.

Na mbụ n'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ndị ọrụ oyibo steeti Anambra, Oriakụ Theodora Igwegbe nyèrè nkọwa banyere oké ụbọchị ahụ nà mpụtara ya, ma kpọpụtasịkwa ụfọdụ ihe dị icheiche ndị ọrụ oyibo steeti ahụ nà ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ mepụtagoro, ya na ụfọdụ ihe iche aka mgba dị icheiche ndị ọrụ oyibo na-agabiga, bụkwa nke na-emetụta arụmọrụ ha na etu ha si arụ ya.

O mere ka a mara na ọchịchị Gọvanọ Soludo enyela nkwàdó ka e nye ndị ọrụ oyibo steeti ahụ nkụzi n'usoro ICT iji kwalite arụmọrụ ha n'usoro ọgbaraọhụrụ, ọbụna dịka o kelèkwàra ya bụ Gọvanọ ma kwe nkwà ịga n'ihu na-arụsi ọrụ ike, iji nyere gọọmenti steeti ahụ aka imezupute atụmatụ ya dị icheiche.

Mmemme ahụ dọtàrà ndị imirikiti ndị ọrụ oyibo steeti ahụ, ndịisi ụlọọrụ dị icheiche, na ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi na steeti ahụ. A nọkwazịrị n'ebe ahụ nye ụfọdụ ndị ọrụ oyibo steeti ahụ mere nke ọma n'ime afọ a onyinye nkwanyeùgwù; ma mekwa emume ịwa achịcha bekee maka óké ụbọchị ahụ, bụkwazị nke mere ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484