Soludo Eduola Ndịisioche Okpuruọchịchị Ọhụrụ n'Iyi Ọrụ

Soludo Eduola Ndịisioche Okpuruọchịchị Ọhụrụ n'Iyi Ọrụ

Izunna Okafor dere akụkọ

Ọ na-abụ a kpụchaa Diji, a kpụnyeghị ya ogbe ji n'aka, ọ dị ka a kpụzughị ya òkè.

N'ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nọrọ ụbọchị Tuzdee wee duo mmadụ iri abụọ na otu ahụ a kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ dịka ndịisioche nchereoge n'okpuruọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti Anambra n'iyi ọrụ maka ịmalite ọrụ n'ozuzuoke.

Ya bụ mmemme idu n'iyi ọrụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmentị dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ka bụrụkwa nke dọtàrà ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ọchịchị steeti ahụ.

Ndị ahụ e duru n'iyi ọrụ na okpuruọchịchị ha gụnyèrè: Chibueze Ofobuike (okpuruọchịchị Aguata), Anselm Onuora (okpuruọchịchị Anambra East), Felix Ikechi (okpuruọchịchị Anambra West), Gerald Ozo (okpuruọchịchị Anaocha), Emmanuel Ucheze okpuruọchịchị Awka North), ThankGod Aniago (okpuruọchịchị Awka South), Livinus Onyenwe (okpuruọchịchị Ayamelum), Augustine Nonyelum (okpuruọchịchị Dunukofia), James Obi (okpuruọchịchị Ekwusigo) Chucks Igboanua (okpuruọchịchị Idemili North), Immaculata Obi (okpuruọchịchị Idemili South), Kingsley Obi (okpuruọchịchị Ihiala) na, Clems Aguiyi (okpuruọchịchị Njikoka).

Ndị ọzọ gụnyere: Mbazuluike Iloka (okpuruọchịchị Nnewi North), Ikenna Aniagbaoso (okpuruọchịchị Nnewi South), Charles Ozoma (okpuruọchịchị Onitsha North), Emeka Orji (okpuruọchịchị Onitsha South), Ogochukwu Ekwueme (okpuruọchịchị Orumba North), Sunday Uchendu (okpuruọchịchị Orumba South), Emmanuel Nweke (okpuruọchịchị Oyi) na Paschal Aniegbuna (okpuruọchịchị Ogbaru).

N'okwu ya oge o duchara ha n'iyi ọrụ ahụ, Gọvanọ Soludo gwara ha na isi sekpụ ntị n'ọrụ chere ha n'ihu bụ ka ha buru atụmatụ gọọmentị gbadaa n'okpuruọchịchị ha dịgasị icheiche ma mezupụta ha nke ọma n'ebe ahụ, na-emekwa ka ndị nọ n'ime ime obodo ha dị icheiche na-esonyesi ike n'ihe gọọmentị na-eme, ma na-emekwa ka ha na-erite uru ma na-eketa òkè n'ihe dị icheiche gọọmentị na-eme.

Ọ gwàkwàrà ha na a kpọlitere ha n'ihi ntụkwasịobi obi e nwere n'ebe ha nọ na ihe ha pụrụ ime, ma gwakwa ha na ọchịchị ya anaghị anabata ịda mba na oke mkpesa enweghị isi; ọbụladị dịka o kwere ha nkwa nkwado zuru okè oge niile ma dụkwa ha ọdụ ka ha gbakwa mbọ chọọ ụzọ ha ga-esi na-enwete ego ha ga-eji na-arụ ọrụ n'okpuruọchịchị ha dị icheiche dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu na-achị ala Nigeria. O kwèkwàrà nkwà na ọ ga na-ejegharị na-elete ka ọrụ ha si aga na mgbe na mgbe.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara okpuruọchịchị na steeti ahụ, bụ Maazị Collins Nwabunwanne kọwàrà na ndị ahụ bụ ndị e hiri asaa n'anya wee kpọlite n'ọkwa ahụ, ka kwupụtakwa olileanya o nwere na ha ga-eme nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

N'okwu ha gwara ndị nta akụkọ n'otu n'otu, ụfọdụ ndị ahụ a kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ, kèlèrè Gọvanọ Soludo maka ohere ọma ahụ o nyere ha ijere steeti ha ozi n'ogoogo ahụ, ma kwe nkwà na ha agaghị agharịpụ ya, okpuruọchịchị ha, na ndị Anambra.

Ụfọdụ ndị dị icheiche sonyere nà mmemme ahụ gụnyèrè Osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim; Osote Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Paschal Agbodike; onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ, bụ Maazị Ernest Ezeajughi, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.