Soludo, Anyanwụ Chakere n'Ụtụtụ

Jul 28, 2022 - 10:04
 0
Soludo, Anyanwụ Chakere n'Ụtụtụ

Chinwendu Uzoatu

 Igbo kwuru sị na ọkụkọ ga-abụ oke na-ebido n'eju. O wee bụrụ ya, nke a pụtara ìhè na ndụ Okammụta Charles Chukwuma Soludo, aka na-achị steeti Anambra. A mụrụ ya n'lsuofia nke dị n'okpuruọchịchị Aguata. O bidoro na nwata kpaba ike.
   Mmiri amachighị nzọụkwụ ọ zọrọ n'ụlọakwụkwọ ebe ọ gụrụ akwụkwọ kọleji, Boy's Secondary School, Uga. Ọ bụ ya bụ onyeisi ụmụakwụkwọ (Senior Prefect) izizi e nwere n'ụlọakwụkwọ ahụ. Ọ rụrụ ọrụ nke ọma ma hụ na ọchịchị ya tụnyere ezi ụtụ n'ebe ahụ.
 O ji ụbụrụ ịnụọkụ baa mahadum, University of Nigeria, Nsukka. O tuuru ugo mmụta kacha elu nke bekee kpọrọ 'First Class' wee pụta. N'ihi nke a, mahadum ahụ weere ya ka ọ malite nkuzi ozigbo ebe ahụ.
 A ga-ekwu ole ghara ibe ya? Ọ kpara ike dị egwu ebe niile ọ rụrụ ọrụ. A ka na-akọ akụkọ banyere ezi ihe o mere mgbe ọ bụ onyeisi, ya bụ, Gọvanọ Ọbaego Etiti Ala Nigeria, Central Bank of Nigeria. Ọ bụ ya nwogharịrị ọnọdụ akụnụba ala anyị, o wee bụrụ ịgba.
 Ọkammụta Soludo bụ onye na-akwụ n'okwu ọnụ ya. Ihe o kwuru taa ka ọ na-ekwu echi. Ọ na-azọpụ ụkwụ ije ka dimkpa. 
 Ozigbo ọ malitere ọrụ dịka Gọvanọ steeti Anambra ka ọ bagidere ma mebe ihe niile o kwere ngwa ọ ga-eme, ma a họpụta ya dịka Gọvanọ Anambra. Ọmụmaatụ bụ mkpocha nke na-aga n'ihu na mpaghara dị icheiche  na steeti Anambra ugbua.
 Ọ bụ dimkpa obi siri ike, ọ naghị ama jijiji, ọ na-ewepụta onwe ya buo agha o kwesịrị ibu, iji megide mpụ na arụrụala, ka obodo weredị mma.
  Soludo bụ Gọvanọ izizi gara leta Nnamdi Kalu n'ụlọmkpọrọ. O mere nke ahụ n'ihi ịṅụ ọkụ n'obi o nwere ka udo chịa. 
 N'ihi mbọ ya iji hụ n'udo dị mgbe niile mere obodo ya ji chie ya 'Dike Udo Isuofia'. Ọ bụ eze ọdịnala obodo ya, Igwe Muoghalu kpunyere ya okpu n'isi nke ọtụtụ ndị Anambra nọ ma gbaa aka ebe.
 Dịka ọ na-eme ncheta ọgbụgba afọ iri isii na abụọ taa, steeti Anambra na-agọrọ ya ọfọ ndụ ndụ na uju amara nke Chineke. Ọ ga-achịka nka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484