Soludo Akatọọla Ogbugbu E Gburu Ndị Amị n'Ụmụnze

Izunna Okafor dere akụkọ a
Gọọmenti steeti Anambra atakọ̀ọ́la ogbugbu e gburu ụfọdụ ndị n'Ụmụnze dị n'okpuruọchịchị ime obodo Orumba South nke steeti ahụ ụbọchị Wenezdee.
Ọ dị ncheta na ụfọdụ ndị omekome a maghị ndị ha bụ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee wakpo ụfọdụ ndị amị nọ n'ọrụ ngagharị, wee gbagbuo ha.
N'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra banyere nke ahụ site n'aka odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Maazị Christian Aburime, Gọvanọ Soludo gbarụ̀rụ̀ ihu banyere ụdị akụkọ ọjọọ ahụ, ma kọwaa ya bụ ọdachi dịka nke jọgburu onwe ya.
O kwuru na gọọmenti ya na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ ga-amà imi n'ala ịchọpụta ndị aka ha dị n'arụ ahụ, ya na ndị nke aka ha dịkwa na mwakpo ahụ a wakpòrò Sinetọ Ifeanyi Ubah n'Enugwu-Ukwu nà nsonso. Ọ sịkwa na e nweghị ebe nzuzo ọbụla maka ndị omekome na steeti ahụ.
Ka ọ na-akasi ezinụlọ ndị ahụ a gbagburu na mwakpo ahụ obi, Gọvanọ Soludo mèkwàrà ka obi sie ndị Anambra ike na gọọmenti agaghị ada mbà n'ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa n'ime steeti ahụ.
Ọ gwàkwàrà ha ka ha nyere gọọmenti aka n'ọrụ ahụ site n'inye ozi maọbụ mkpesa banyere ọnọdụ nà ije ụkwụ ọbụla ha na-enyo enyo.
What's Your Reaction?






