Soludo Agbapeela Ogige Inye Ọgwụgwọ Site n'Ekwentị n'Anambra

Soludo Agbapeela Ogige Inye Ọgwụgwọ Site n'Ekwentị n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịora steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo agbapeela ogige ebe a ga na-ahazi atụmatụ maka inye mmadụ ọgwụ nà ọgwụgwọ site n'usoro nzikọrịtaozi ekwentị n'ime steeti ahụ.

Ya bụ ogige a kpọrọ ‘Anambra State Telemedicine Hub’ bụ nke a rụrụ n'Awkuzu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi, ma bụrụkwa nke Gọvanọ gbapere ụbọchị Wenezdee. 

Ogige ahụ a rụrụ n'ime ‘Comprehensive Medical Centre, Awkuzu’ bụ̀kwà nke a rụrụ site na njikọaka ndị òtù Adimma Awkuzu nà isi ụlọọrụ na-ahụ maka Ahụike na steeti Anambra.

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ na-agbape ya bụ ogige, Gọvanọ Soludo kọwàrà atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya n'ihi na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ dị ukwuu n'imezupute ezi ebumnobi gọọmenti ya nwere, inye ụmụafọ steeti ahụ ezi ọnọdụ ahụike bụ ị̀gbà, ya na inwògharị̀ ngalaba ahụike steeti ahụ n'ozuzuoke.

O kwuru na atụmatụ ahụike ahụ ga-enyekwa aka ime ka ndị bi n'ime-ime obodo dị icheiche tere aka na steeti ahụ na-enwetekwa mgbataọsọ, ọgwụgwọ na ezi nlekọta ahụike ngwangwa oge ọbụla ha chọrọ ya, ọkachasị oge e nwere ọnọdụ mberede, n'ihi na akụrụngwa ahụ ga-enye aka ịchọpụta ihe na-arịa onye ahụ, ma nyekwa ya ọgwụgwọ.

O tokwàzị̀rị̀ ndị òtù ahụ rụrụ ogige ahụ site na njikọaka ụlọọrụ gọọmenti, ma kpọọ òkù ka e jigidesie ụdị njikọaka ahụ n'etiti ndị nnọrọonwe na gọọmenti.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Afam Obidike nyèrè nkọwa banyere otú usoro nlekọta ahụike ahụ si arụ ọrụ, ma kọwaa na isi sekpụ ntị n'ebumnobi atụmatụ ọhụrụ ahụ bụ iji mee ka ndị bi n'ime-ime obodo na-enwete ezi nlekọta ahụike oge ọbụla ha chọrọ ya, n'enweghị ihe mgbakasị ahụ ọbụla.

Ọ gbara akaebe na ọchịchị Gọvanọ Soludo na-enwogharịsị ihe niile n'usoro dijitalụ, ma ngalaba ahụike; ọbụladị dịka o kèlèrè ya maka ịkwàdò na ime ka nke ahụ bịa na mmezu.

Ụfọdụ ndị sonyere nà mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ụlo ahụike mahadum ‘Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital, Amaku Awka’, Dọkịta Josephat Akabuike; Onyeisi ụlọọrụ atụmatụ nchekwa ahụike ‘Anambra State Health Insurance Agency (ASHIA), Dọkịta Simeon Onyemaechi; eze ọdịnala obodo Awkuzu, bụ Igwe Charles Anikweze; Ashbisọp Maxwell Anikwenwa lagoro ezumike nka, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.