Soludo Adụọla Ndị Ụka Ka Ha Na-ejikọ Aka Ọnụ

Soludo Adụọla Ndị Ụka Ka Ha Na-ejikọ Aka Ọnụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo akpọkuola ndị ụka dị icheiche, ọkachasị n'ime steeti Anambra, ka ha jisie ike na-akwàlite ịdịnotu, ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ha, iji nye aka ibuli steeti ahụ  na ọchịchị ya n'ogoogo dị elu.

Gọvanọ Soludo kpọrọ oku a n'okwu ya na mmemme e jiri pịachie mmerùbé ncheta ọgbụgba ahọ iri isii onye bụ Achbishọp mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọp ụka Anglịkan na Dayọsis Awka, bụ Most Reverend Alexander Ibezim.

Ya bụ oke mmemme bụ nke were otu izuụka ma bụrụkwa nke a chịkọtara n'ụlọụka ‘Cathedral Church of St. Faith’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Mmemme ahụ dọtàkwàrà ọtụtụ ndịisi ụka, ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria, bụ ndị bịara isoro Achbishọp Ibezim ṅụ̀rịa n'ọgbụgba ahọ iri isii ya.

Ọ bụ̀kwa mmemme a nọrọ na ya merùbé ncheta ọgbụgba ahọ iri na abụọ ya bụ nwaamadi, Ibezim, nọ̀gòrò n'ọkwa dịka Bishọp, ahọ atọ ọ nọ̀goro n'ọkwa dịka Achbishọp, ahọ iri abụo nke alụmdinanwunye ya, na ahọ iri abụọ na asatọ zuru ezu ọ jegoro ozi n'ụlọ Chineke dịka onye ọrụ ụka e chiri echi.

N'okwu ya n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Soludo kọwàrà oké mkpà ọ dị inwe ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ndị ụka dịgasị na steeti ahụ, bụkwa nke ya onwe ya na ọchịchị ya nyegooro aka na-akwàlite n'ụzọ dị icheiche, ọkachasị, site ime ka ma ndị ụka Anglịkan, ndị ụka Katọlik, na ndị ụka ọgbaraọhụrụ ndị ọzọ na-esonye na-enye aka n'ịhazi na ịchịkọ̀bà ekpere a na-eme n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbia kwà ụbọchị ọbụla n'izuụka, dịka ụbọchị e nyere ha siri dị.

O kwupụtàrà na obi tọrọ ya ụtọ oge ọ nụrụ na Achbishọp Ibezim gara njem nleta na nke ndị ụka Katọlik dịka otu n'ime mmemme dị icheiche o jiri izuụka ncheta ọgbụgba ahọ ya ahụ; ma kpọọ òkù ka a jigide ụdị mmekọrịta ahụ, n'ihi na ụdị ezi mmekọrịta dị etu ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ibuli steeti ahụ elu.

Na ntụnye nke ya, aka na-achị steeti Delta, bụ Gọvanọ Ifeanyi Okowa, tòrò Chineke màkà ndụ, ahụike na ijeozi Achbishọp Ibezim, nàkwà ụzọ dị icheiche O sigoro jiri ya kwara ngwaọrụ.

O kpekwazị̀rị̀ ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya, inye ya ahụike na iji ya kwara ngwaọrụ n'ịgbasà oziọma nke alaeze ya, ọbụladị dịka ha kpekwàrà ka Chineke tụkwasara ya ndụ n'elu ndụ na amamihe n'elu amamihe.

Achbishop Ibezim, na nzaghachi ya, kèlèrè ndị niile bịara nọ̀nyere ya ma sorokwa ya ṅụrịa n'ọgbụgba ahọ iri isii ya, ma kelekwa ndị nyere aka maọbụ tụnye ụtụ n'ótù ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na mmemme ahụ gara nke ọma, malite na mbido ruo na njedobe.

Ya bụ Achbishọp, onye kwupụtàrà na ndụ ya jupụtàrà n'akụkọ ọgbụgbaama, fọ̀rọ̀ ekele n'ụkpa wee bunye Chineke maka ọrụ ebube dị icheiche ọ rụrụ na ndụ ya, malite na mgbe ọ bụ nwata, wee ruo ugbua.

A nọrọ na ya bụ mmemme waa achịcha bekee e jiri merùbé oke ụbọchị ahụ, kpee usoro ekpere dị icheiche, bupute akwụkwọ ọhụrụ e dere maka ndụ Ibezim na ijeozi ya; tụọ mmamma, ma nwekwazie oriri na ọṅụṅụ, nke mere ka ụbọchị ahụ dị ka aha a kpọrọ ya.

Ụfọdụ ndị ọzọ dị icheiche sonyere nà mmemme onye na-anọchi ọgbọ nta nkwàdó Anambra etiti n'ụlọ omeiwu sinet ala Nigeria, bụ Iyom Uche Ekwunife; nwunye Osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Oluchi Ibezim; nwunye Achbishọp Ibezim, Oriakụ Chioma Martha Ibezim, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.