Òtù Obijackson agbatarala ndị iju mmiri chụpụ̀rụ̀ be ha ọsọ enyemaka

Dec 1, 2022 - 07:32
 0
Òtù Obijackson agbatarala ndị iju mmiri chụpụ̀rụ̀ be ha ọsọ enyemaka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Okwu Igbo bụ ‘Ọnụ̀rụ̀ ube nwanne agbala ọsọ’ bụ nke pụtara ìhè ọzọ na nsonso a, dịka òtù ọrụ obiebere a maara dịka òtù ‘Obijackson Foundation’ kesààrà ndị ahụ iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n'ụlọ ha ihe nkwàdó nà ihe oriri dị icheiche na mpaghara ebe dị icheiche na steeti Anambra.

Otu ahụ isi ụlọọrụ ya dị n'Okija, n'ime okpuruọchịchị Ihiala nke steeti Anambra, bụ nke a ma ama n'inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka, inye nkwàdó nàkwà ịkwàlite ọdịmma ụmụ mmadụ na mmepe. Ya bụ òtù bụkwa otu nnọrọonwe, nke nwa amadi ọrụ obiebere na-amasị, bụ Maazị Ernest Obiejesi hibere.

Ihe enyemaka na ihe nkwàdó dị icheiche òtù ahụ kesààrà ndị ahụ iju mmiri chụpụ̀rụ̀ be ha bụ nke gburu nde kwuru nde naịra, ma bụrụkwa nke e bugaara ha n'ogige ụlọikwuu dị icheiche ebe ha nọgide ezere mmiri kemgbe ahụ iju mmiri wakpòrò ụlọ ha dị icheiche.

Ebe dị icheiche e kesaara ndị ahụ ya bụ ihe nkwàdó gụnyèrè ogige ụlọ ikwuu dị na mpaghara Ogbaru, bụ ‘Unity Primary School Camp, Umuoba Anam’, na ogige ‘Father Joseph Memorial Camp’ dị n'Aguleri, n'okpuruọchịchị ime obodo Anambra East. Ihe nkwàdó ahụ e kesaara ha gụnyèrè àkpà osikapa, achịcha, igbe ncha e ji asa ahụ, tinyere ọtụtụ ihe oriri ndị ọzọ na ihe e ji enyere ndụ aka.

N'okwu ya banyere ihe ahụ ha kesàrà, onye duru ndị òtù ahụ wee bịa ya bụ njem, bụ Maazị Chukwudi Enukoha kwùrù na ọnọdụ ahụ ndị ahụ nọ na ya na ihe nhịahụ dị icheiche ha na-agabiga n'ihi ajọ ọdachi ahụ dabidoro ha na-emetụ onyeisi òtù ahụ bụ Dọkịta Obiejesi n'obi, bụkwazị nke mere o jiri kpebie ịgbatara ha ọsọ enyemaka.

O kwùrù na nke ahụ so n'otu n'ime ọrụ obiebere dị icheiche òtù ahụ na-abagide na ya, ma kwuo na ebumnobi ya bụ iji belatara ndị ahụ mmetụta nke ajọ ọdachi iju mmiri ahụ, ya na iji hụ na ha nwere ihe ha ji aracha mmanụ ma na-eleru ndụ anya ma ha laghachi ebe obibi ha dị icheiche.

Na ntụnye nke ya, onye ndu ime mmụọ nke òtù ahụ, bụ Fada Leonard Ayogu kwuru na nzọpụ ụkwụ ahụ òtù ahụ zọpụrụ̀ bụ nke dabara adaba na nkụzi nke Kraịst, bụ onye dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha na-eleru ndị ụwa na-atụ n'ọnụ anya ma na-enyekwara ha aka.

O jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ndị mmadụ na ndị òtù ndị ọzọ dị icheiche ka ha gbatakwara ndị ahụ iju mmiri chụpụ̀rụ̀ n'ụlọ ha ọsọ enyemaka, maka na ọnọdụ ha dị imere ebere n'ezie, n'ihi ihe dị icheiche ha na-agabiga.

Na nzaghachi ha n'otu n'otu, Ndị Nlekọta ogige abụọ ebe ahụ e kesàrà ihe nkwàdó na ihe enyemaka ahụ, bụ Maazị Victor Nmeoba na Maazị Ben Nwasike, nyèrè obere nkọwa banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ogige ahụ na ihe dị icheiche ndị nọ ebe ahụ na-agabiga.

Ha kelèkwàzị̀rị̀ otu Obijackson  maka mgbataọsọ ahụ ọ gbataara ha, kpee ka Chineke kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji; ma rịọkwazie ndị ọzọ ọnọdụ dịtụụrụ mma ka ha gbatakwara ha ọsọ enyemaka, maka na ọ bụrụ na nwannụ̀nụ̀ ihe na-esiri ike mechie ọnụ ya, agụụ egbughị ya, akpala afụ̀chie ya ike.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484