Otu Afọ n'Ọkwa: Ọchịchị Soludo Na Ụfọdụ Ihe O Mepụtagoro

Mar 17, 2023 - 12:45
 0
Otu Afọ n'Ọkwa: Ọchịchị Soludo Na Ụfọdụ Ihe O Mepụtagoro


Izunna Okafor dere akụkọ a

Taa ka o mere otú afọ zuru èzù aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo jiri banye n'ọkwa dịka gọvanọ nke ise steeti Anambra nwegoro n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

Gọvanọ Soludo bụ onye e duru n'iyi ọrụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị afọ 2022, bụkwa ụbọchị ọ malitere ọrụ ozigbo

Edemede a na-eleba anya n'ụfọdụ ihe dị icheiche dara ụda ọchịchị Soludo mepụtagoro kemgbe otu afọ gara aga o jiri malite.

Ihe mbụ Gọvanọ Soludo mere ka e duchara ya n'iyi ọrụ n'abalị iri na asaa ọnwa Maachị bụ ịga ebe idei mmiri na-enye nsogbu n'Àkwammiri Sakamori dị n'Okpoko, n'okpuruọchịchị Ọgbaru, bụ ebe ọ malitere ọrụ ozigbo ikpochaa ya bụ ebe ka ọ dịkwa ka ebe mmadụ bi.

Ka ọ dị taa, a sụgheela ọwammiri Sakamori ahụ sụchiri asụchi n'oge mbụ, nke mere ka mmiri niile dọ ebe ahụ n'oge mbụ hughesie ma na-agazịrị onwe ya ugbua.

Malite ụbọchị ahụ e duru ya n'iyi ọrụ ruo taa, ọchịchị Soludo akpatụla aka ma mepụta ihe dara ụda na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ. Na ngalaba ọrụ ugbo, Gọvanọ Soludo, ka ọ na-agbape amụmà ọrụ ugbo nke afọ 2022 n'ime steeti Anambra, nọrọ ebe ahụ wee kesaara ọtụtụ ndị ọrụ ugbo nọọ na steeti ahụ mkpụrụ akụkụ ọrụ ugbo dị icheiche n'efu maka ịkụnye n'ugbo ha. Ọ nọkwara n'ime izuụka olenaole gara aga wee gbapee atụmatụ ịkụ akị oyibo na akwụ ruru otu nde n'ọnụọgụgụ na mpaghara ebe dị icheiche n'ime steeti ahụ.

Banyere ọnọdụ gburugburu, n'ịga n'ihu n'ime o mere na Sakamori, Gọvanọ Soludo nọrọ n'abalị ise nke ọnwa Juunu afọ 2022 wee gbapee atụmatụ ịkụ ọtụtụ osisi na steeti Anambra, iji chekwaa ma kwalite ịmamma nke gburugburu steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo ekpochasịkwala ọtụtụ ebe na-erubụ ajọ unyi na mpaghara Onitsha nà mpaghara ebe ndị ọzọ na steeti ahụ, ma kwalitekwa usoro e si ekpo ahịhịa na àtịtị na steeti ahụ, iji mee ka steeti ahụ chawapụ. Ọchịchị Soludo agbanwèkwala usoro e si ekpo ahịhịa na steeti Anambra, ka ọ bụrụzie nke ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ikpo ahịhịa na steeti ahụ ga na-aga n'ụlọ n'ụlọ na-eburu, karịa ndị mmadụ ịdị na-agazị ebe ekpofu ahịhịa edebe ha.

Na ngalaba ahụike, ụfọdụ ihe dị icheiche Gọvanọ Soludo mepụtagoro na ngalaba gburugburu metụtakwara ngalaba ahụike n'ihi na ebumnobi ụfọdụ n'ime ha bụ iji nye aka kwalite ọnọdụ ahụike steeti ahụ na ụmụafọ ya, ọkachasị dịka o siri metụta idebe gburugburu ọcha. Ọ nọkwara n'afọ gara aga wee zọpụ ụkwụ imemila na ịchụ ọrịa ịba ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ, bụkwa ebe a nọrọ wee kesaa ụlọ mgbochi anwụnta n'efu n'ime steeti ahụ. Ka nke ahụ na-aga n'ihu, ọ gbapere ogige ebe a ga-arụ ahịa ọgbọ ọgwụ mba ụwa n'Ọba, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Idemili South nke steeti ahụ, nke ga-abụ ebe kachasị buo ibu a na-ere ọgwụ na mpaghara Africa ma ọ bụrụ na a rụchaa ya. Ọrụ ka na-agakwa n'ihu ebe ahụ ugbua.

Gọvanọ Soludo nọkwàrà na nsonso a wee wèé ndị ọrụ ahụike karịrị narị ato na iri ise n'ọrụ na steeti Anambra iji kwalite ngalaba ahụike na arụmọrụ ụlọọgwụ dị icheiche na steeti ahụ.

N'ihe gbasaara agụmakwụkwọ, ngwangwa ọ batara n'ọchịchị, Gọvanọ Soludo zọpụrụ ụkwụ ozigbo ịkwalite ngalaba agụmakwụkwọ steeti ahụ, bụkwa nke o kwenwòrò nkwà ime mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme ụbọchị ụmụaka nke afọ gara aga, nke e mere n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee afọ ahụ. Na ngalaba agụmakwụkwọ ahụ, ọchịchị Soludo eweela ndị nkụzi ruru puku ise n'ọrụ na steeti ahụ, bụkwa ndị malitegoro ọrụ kemgbe ọnwa olenole gara aga. Ọ nọkwàrà na nsonso a wee kwuo na ọ ka ga-ewèkwu ọtụtụ ndị nkụzi ọzọ n'ọrụ na steeti ahụ oge adịghị anya. Ihe a dara ụda Soludo mèrè na ngalaba agụmakwụkwọ abụghị naanị na ọ ga-enye aka n'ịkwalite ngalaba mmụta steeti ahụ, kama, o nyekwara aka n'ụzọ pụrụ iche ibelata ọnụọgụgụ enweghị ọrụ na steeti ahụ.

Banyere ịkwalite udo na nchekwa, ọ bụ ihe doro anya na e nwere mgbe ajọ ọnọdụ nchekwa laghachikwara azụ na steeti Anambra, ọbụladị tupu Gọvanọ Soludo weghara ọnọdụ. Kaosiladị, kemgbe ọ batara, ọchịchị ya agbaala ọtụtụ mbọ dị icheiche pụtara ìhè, iji weghachite ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ. Otu n'ime mbọ a bụ ịkpọ nzukọ ọtụtụ ugboro maka ọnọdụ nchekwa, nke ọ kpọrọ ma ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche na ndị òtù dị icheiche na-eselite isi, na-arịọ  maọbụ na-enye nsogbu n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ n'ime steeti ahụ, ọbụladị ma ndị otu ‘Indigenous People of Biafra (IPoB), na ndị ọzọ. Otu n'ime ebumnobi mmemme ahụ bụ ka a tụkọọ ero ọnụ maka iwete udo na ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.

Ọ gakwara leta onyeisi otu IPoB, bụ Maazị Nnamdị Kanu ebe ahụ a kpọchiri ya n'ogige ndị ọrụ nchekwa DSS, dịka otu n'ime nzọpụụkwụ ya iji weghachite udo na nchekwa na steeti ahụ na mpaghara ala Igbo n'izugbe. N'ihe gbasakwara nchekwa, Gọvanọ Soludo nọrọ na mgbasaozi izugbe o mere na nsonso a 0 wee wepụtasịa ụfọdụ ntụziaka na atụmatụ dị icheiche a ga-agbaso na steeti ahụ iji weghachite nchekwa na udo tọrọ atọ. Atụmatụ a na ntụziaka ndị a enwekwala aka n'ọtụtụ ụzọ dị icheiche ịkwalite ịjide ụfọdụ n'ime ndị omekome ahụ na-enye nsogbu na steeti ahụ, na ibibi ebe nzuzo ha.  Ka ọ dị taa, Anambra ajụọla oyi ma nwekwa ezi ọnọdụ nchekwa.

Ọchịchị Soludo enyekwala aka ikpezi esemokwu nà iwètà udo tọrọ atọ n'etiti obodo iri asatọ na atọ n'ime obodo dị icheiche na-enwe nsogbu na ọgbaghara n'ime steeti ahụ tupu ọ bata n'ọchịchị.

N'ịga n'ihu, ọchịchị Gọvanọ Soludo emeela ọtụtụ ihe dị icheiche n'ịkwalite mmepe steeti ahụ n'izugbe, nke gụnyere ịgbape mmalite ọrụ okporoụzọ ruru narị abụọ na iri isii n'ọnụọgụgụ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ. N'okwu ya oge ọ na-agupụ̀tara ndị omeiwu nkọwa ámụmà ego ọrụ ọhụrụ steeti ahụ a hazigharị̀rị̀ ahazigharị, o mere ka a mara na pasentị iri isii na anọ n'ime ego ọrụ ahụ bụ màkà ọrụ mmepe obodo; ma kọwakwa na a hụtara mkpa ọ dị ịhazìgharị̀ ego ọrụ ahụ n'ihi etu ọnọdụ akụnụba nà ọnụ ahịa ihe siri dị ugbua. 

Ọchịchị Soludo kesàkwàrà ego nkwàdó ruru nde kwuru nde naịra nyegara ọtụtụ obodo dị icheiche na steeti ahụ iji kwalite ọnọdụ mmepe obodo ha, bụ nke e mere site n'okpuru ụlọọrụ 'Anambra State Community and Social Development Agency (ANCSDA)’.

Obodo dị icheiche soro keta ego ahụ n'agba nke a gụ nyere Oroma-Etiti dị n'okpuruọchịchị Anambra West, Urum dị n'okpuruọchịchị Awka North, Ifite-Ogwari dị n'okpuruọchịchị Ayamelum, Ndiokolo dị n'okpuruọchịchị Orumba North na Ezira dị n'okpuruọchịchị Orumba. Amụma ahụ ka na-agakwa n'ihu ugbua.

Ọchịchị Soludo azọpụkwala ụkwụ n'idozigharị ụfọdụ okporoụzọ mebisiri emebisi ma rụọ ndị ọhụrụ, iji hụ na e nweghị ajọ ọnọdụ okporoụzọ na steeti ahụ. Ọ bụkwa n'ihi nzọpụụkwụ a ka o jiri nọrọ na nsonso a wee dozisie ebe ahụ mebisiri emebisi na mpaghara Amansea n'ogologo okporoụzọ ahụ siri Onitsha gaa Enugu. Ka ọ dị taa, okpuruọchịchị niile dị na steeti Anambra nwèrè ọrụ okporoụzọ na-aga n'ihu n'ime ya ugbua.

Na ngalaba ndị ntorobịa, Gọvanọ Soludo enyela ọtụtụ ndị ntorobịa steeti Anambra ọrụ na nkwàdó dị icheiche iji mee ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha. Ọtụtụ n'ime ndị Gọvanọ ahụ kpọlitere n'ọkwa ọrụ dị icheiche na steeti ahụ bụcha ndị ntorobịa, bụkwa nke na-egosi na ihe gbasara ndị ntorobịa na-echu ya ụra.

Ọ nọkwara na nsonso a wee malite amụmà inye nkụzi na ọzụzụ ọrụ aka dị icheiche maka ndị ntorobịa steeti ahụ, nke a kpọrọ “One Youth, Two Skills”. Ya bụ ọzụzụ bụ nke na-aga n'ihu ugbua, ma bụrụkwa nke a na-ahazi site n'aka ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ntorobịa na steeti ahụ. Gọvanọ kwere nkwà na mgbe e nyechara ndị ahụ ọzụzụ ahụ, a ga-enye ha ego nkwàdó ha ga-eji wee malite ihe dị icheiche ha mụrụ.

Ọchịchị Soludo achụọla ndị ọrụ Agbero ọsọ ụkwụ eru ala na steeti Anambra, butuo ọnụ ego ụtụ isi ndị na-anyà ụgbọala na ndị Keke na-akwụ na steeti ahụ, ma hazigharịkwa usoro e si anakọ ụtụ isi na steeti ahụ, iji gbochie ụzọ dị icheiche ndị mmadụ si ezufusi ego gọọmenti.

N'ime otu afọ o jiri banye n'ọkwa, ọchịchị Soludo ahazigharịala ma gbanwee usoro e si arụ ọrụ na usoro gọọmenti si emegasị ihe dị icheiche na steeti ahụ ka ha dịzie n'usoro dijitalụ na usoro ọgbaraọhụrụ.

Ihe ndị a niile na ọtụtụ ihe ndị ọzọ bụ nke Gọvanọ Soludo mepụtara naanị n'ime otu afọ o jiri banye n'ọchịchị. Nke a na-egosi na ya bụ ọkụkọ ga-abụ oke ebidolarị n'ejù mebe ihe oke. Nke a pụtakwara na olileanya dị ebe a na-aga, na ya bụ Gọvanọ ga-emekwa nke kacha nke n'ọdịnihu.

N'ọchịchị Soludo, ebe nke azụ dị etu, kedụzị ka nke ihu ga-adị?

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484