Oriakụ Soludo Adụọla Ụmụnwaanyị Ka Ha Na-akwàlite Udo n'Obodo

Oriakụ Soludo Adụọla Ụmụnwaanyị Ka Ha Na-akwàlite Udo n'Obodo

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ụmụnwaanyị ka ha bụrụ ndị na-enye aka ịkwàlite udo n'obodo na n'ezinụlọ ha dị icheiche.

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Nonye Soludo bụ ya nyere ndụmọdụ n'okwu ya na mmemme imerube Mmemme Ụbọchị Udo n'ụwa, bụ ‘International Day of Peace’ nke afọ 2022.

Ọ kọwàrà ụmụnwaanyị dịka ndị nwere ọrụ pụrụ iche dịịrị ha n'ịkwàlite udo n'obodo ọbụla, ọkachasị site n'ịgba mbọ hụ na udo na-achị n'ezinụlọ ha dị icheiche. O mèkwàrà ka a mara na udo so n'ihe kachasị mkpà n'obodo ọbụla na n'ụwa gbaa gburugburu, maka na mmepe anaghị abata n'ezinụlọ maọbụ obodo ọbụla ebe udo adịghị. 

Ọ kpọpụtasị̀rị̀ ụfọdụ ihe dị icheiche na-adọghachi udo azụ n'obodo, ma kpọkuo ndị ọnụ na-eru n'okwu na ndị e ji okwu ha agba izu ka ha nye aka n'igbochi ihe ndị ahụ, maka na ịkwàdò udo bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla.

O kwuru na ọchịchị di ya bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo na-agbasi mbọ ike n'ụzọ dị icheiche ịkwàlite udo na steeti ahụ, ma na-agbakwa mbọ ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa na igbochi ihe dị icheiche na-adọghachi udo azụ n'obodo.