Onyeisioche Nnewi South Eguzobela Òtù Ọrụ Mkpocha na Nzacha n'Ime Wọọdụ

Onyeisioche Nnewi South Eguzobela Òtù Ọrụ Mkpocha na Nzacha n'Ime Wọọdụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisioche okpuruọchịchị ime obodo Nnewi South dị na steeti Anambra, bụ Maazị Ikenna Aniagbaoso eguzobela òtù ọrụ pụrụ iche maka mkpocha na nzacha n'ime wọọdụ dịgasị n'obodo dị icheiche dị n'okpuruọchịchị ahụ.

Òtù ahụ, nke a kpọrọ ‘ASWAMA Ward Committees’ bụ nke e guzobere ụbọchị Tuzdee n'isi ụlọọrụ okpuruọchịchị ahụ dị n'Ukpor, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị mmadụ a gụpụtara site n'ime wọọdụ iri abụọ dị n'okpuruọchịchị ahụ sò na ya.

N'okwu ya banyere otu ahụ, Maazị Aniagbaoso kọwàrà na ebumnobi e jiri guzobe ya bụ ka ha na-elekọta ọrụ mkpocha na nzacha ma nyekwa aka na-ahazi ijikwà atịtị otu kwesiri ekwesi n'ime wọọdụ ha na obodo ha dị icheiche, site n'ịhụ na a na-ekpofu ndị kwesiri mkpofu ebe ziri ezi ma na-ejikwa ndị ọzọ a gaghị ekpofu ekpofu otu kwesiri ekwesi.

Ọ sị na ndị òtù ahụ ga-enyekwa aka n'ịhazi ịkụ osisi n'obodo ha dị icheiche n'okpuruọchịchị ahụ, iji gbochie nsogbu mbize, nà iji mee ka okpuruọchịchị ahụ na okporoụzọ dịgasị na ya chawapụ ma na-amụkekwa ka ọnwa.

Ọ gàkwàrà n'ihu kọwaa na atụmatụ ahụ dabara adaba n'ezi ebumnobi ọchịchị Gọvanọ Soludo ime ka steeti ahụ chawapụ ma dịkwa mma obibi; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị Nnewi South ka ha nye aka ma nyekwa ndị òtù ahụ nkwàdó zuru okè iji rụọ ọrụ ha nke ọma ma mezupụtakwa ya bụ ezi ebumnobi e jiri guzobe ha.

Na ntụnye nke ya oge a gbara ya ajụjụọnụ, otu onye n'ime ndị òtù ahụ, bụ Maazị Tony Ezepuo sitere Ebenator, kèlèrè Maazị Aniagbaoso maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, nke o kwuru na ọ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ịkwàlite ọnọdụ adịmọcha okpuruọchịchị ahụ. O kwèkwàrà nkwà na ọ ga-arụ ọrụ ya nke ọma otu a tụrụ anya, iji nye aka n'imezupute ya bụ ọmarịcha ebumnobi e jiri guzobe òtù ahụ.

Mmemme ahụ dọtàrà ndị ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka mkpocha na nzacha na steeti Anambra, bụ ndị ụlọọrụ ‘Anambra State Waste Management Agency (ASWAMA)’ na-elekọta mpaghara okpuruọchịchị Nnewi South; ma bụrụkwa mmemme a nọrọ na ya nye ndị òtù ahụ nkụzi banyere ọrụ chere ha n'ihu nà ihe dị icheiche a na-atụ anya n'aka ha.