Onyeisi Uweojii Ọhụrụ Awụchaala na ‘Zone-13’ Ukpo

Izunna Okafor dere akụkọ a
Onyeisi uweojii ọhụrụ nọrọ na nsonso a wee wụchaa na mpaghara Zoonù 13 (Zone 13) dị n'Ukpo, nke jikọtara steeti Anambra na steeti Enugu.
Nwa amadi ahụ, bụ AIG Abutu Yaro bụ onye weghaara ọkwa ka ọ gachara abalị olenole onye nke pụrụ apụ, bụ AIG Umar Muri lachara ezumike nka.
Dịka ozi a kụpụ̀rụ̀ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ụlọọrụ ahụ, bụ Nkeiruka Nwode siri kọwaa; AIG Yaro bụ onye nke ise na-anọ̀ n'ụlọọrụ ahụ dịka onyeisi uweojii mpaghara ahụ kemgbe e jiri kepụ̀ta ya n'abalị asatọ nke afọ 2020.
Dịka o siri kọwaa, ya bụ onyeisi ọhụrụ bụ onye jipùrù ọkwa na nsonso a dịka onyeisi uweojii na steeti Edo ma bụrụkwa onye jigoro ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ dị icheiche, tupu e zite ya Anambra.
N'okwu ya oge a nabatachara ma dugharịchaa ya na gburugburu ụlọọrụ ahụ; AIG Yaro kwuru na ọbịbịa ya na ọrụ ya n'ebe ahụ ga-agbadokarị ụkwụ n'ịhazigharị na iwulitekwu ezi ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ ka ọ kawanye mma. O kwukwàrà na ọ ga-azọpụ̀ ụkwụ ịkwàlite ezi mmekọrịta na ezi njikọaka n'etiti ụlọọrụ ahụ na ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu, ma kwàlité ntụkwasịobi ndị mmadụ n'ebe ndị ọrụ uweojii nọ.
AIG Yaro jikwazịrị ohere ahụ dụọ ndị ọrụ ya ọdụ ka ha dị uchu n'ọrụ, ma dụ̀kwa ọhaneze ọdụ ka onye ọbụla sepu na mpụ na arụrụala ma na-edebe iwu, n'ihi na ya ga-arụ ọrụ ya n'ozuzuoke etu iwu siri kwado ya.
Maazị Abutu Yaro banyere n'ọrụ uweojii n'afọ 1988, ma bụrụkwa onye nwere nzere digrii n'ihe ọmụmụ ‘Public Administration’ site na mahadum ‘Ahmadu Bello University, Zaria’. Ọkwa dị icheiche o jigoro tupu ọ bụrụ onyeisi mpaghara Zone 13 gụnyèrè: onyeisi òtù ‘Police Counter-Terrorism Training School, Nonwa’ dị na steeti Rivers; onyeisi uweojii na steeti Zamfara, onyeisi uweojii na steeti Imo, na onyeisi uweojii na steeti Edo, bụ ebe ọ nọ e wee kpọlite ya n'ọkwa ọhụrụ a.
What's Your Reaction?






