Onye Nta Ebutela Akpa PVC A Dọbara n'Ime Ọhịa n'Anambra

Feb 23, 2023 - 00:23
 0
Onye Nta Ebutela Akpa PVC A Dọbara n'Ime Ọhịa n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu onye nta a maghị aha ya nọrọ ụbọchị Wenezdee wee hụ ma bute akpa akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ, bụ ‘Permanent Voters' Card’ (PVC) n'otu ime ọhịa dị na Nnewi, n'okpuruọchịchị ime obodo Nnewi North nke steeti Anambra.

Ya bụ àkpà bụ nke e butere n'ime ọhịa dị na mpaghara Akamili, ma bụrụkwa nke PVC ruru puku kwuru puku juru n'ime ya.

Onye nta ahụ butere ya bụ akpa bùrùkwàrà ya wee gaa n'ụlọ mgbasaozi Authority FM dị na Nnewi ahụ, bụ ebe ọ nọrọ wee kọwaara ha ka ya na ije siri gaa, ma rịọkwazie ha ka ha nye aka n'ịgbasa ozi banyere nke ahụ, ka ndị nwe PVC ahụ wee bịa were ha.

N'okwu nke ya banyere ya bụ ihe, onyeisi ụlọ mgbasaozi ahụ, bụ Maazị Charles Ede kwùrù na ya anọghị n'ụlọọrụ ya oge ahụ e butere PVC ahụ, mana ndị ọrụ ya gwara ya banyere ya.

Ihe a hụrụ site n'onyonyo gbasara site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ banyere PVC ahụ na-akọwa na ihe ahụ bugasị PVC dị mma, ma na-egosikwa na ụfọdụ n'ime ha bụ nke ndị sitere mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Nnewi South, bụ ndị ahụghị nke ha oge ha gara iwere ya n'ụlọọrụ INEC.

Otu onye ọzọ sitere ụlọ mgbasaozi ahụ, bụ Ikenna, mèrè ka a mara na e buuru PVC niile ahụ buga ya n'Obi Umudim Nnewi, ma kpọkukwazie ndị ahụghị nke ha oge ha gara n'ụlọọrụ INEC ka ha gaa n'ebe ahụ e bugara akpa PVC ahụ, ga mara na nke ha ọ dị ebe ahụ.

Mbọ a gbara inweta ọnụ mmiri okwu onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ INEC n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Kingsley Agwu, amị̀tàghị̀ mkpụrụ, n'ihi na akara ekwentị ya agaghị aga.

N'okwu nke ya, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu, kọwàrà na ha enwetabèghị ozi ọbụla site n'aka ụlọọrụ INEC banyere nke ahụ.

O kwukwazị̀rị̀ na Onyeisi ndị uweojii steeti ahụ bụ CP Echeng Echeng enyela ntụziaka ka e mee nnyocha miri emi banyere ya bụ okwu, iji chọpụta isi ya ma nwụchikọọ ndị rụrụ arụrụala ahụ, nyekwa ha ntaramahụhụ kwesiri ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484