Ọnwa Mba: A Dụọla Ndị Na-Anyà Ụgbọala Ka Ha Hie Asaa n'Anya n'Oge a

Izunna Okafor dere akụkọ a
A kpọkuola ma dụọ ndị na-anyà ụgbọala ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, ma zèére ihe ọbụla nwere ike ibute Ihe mberede okporoụzọ, ọkachasị n'ime ọnwa mbà a a banyègòrò.
Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo so na ndị kpọrọ òkù a nà mmemme otu ụbọchị a chịkọ̀bara site n'aka ndị ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nchekwa okporoụzọ, bụ ụlọọrụ Federal Road Safety Corps, FRSC (ngalaba steeti Anambra). Ya bụ mmemme a kpọrọ Mmemme Mgbape Atụmatụ Nchekwa Okporoụzọ Maka Ọnwa Mbà, bụ̀ nke weere ọnọdụ n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu.
N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo, nke onye nochitere anya ya na mmemme ahụ bụ Kọmishọna na-ahụ maka njem okporoụzọ, bụ Oriakụ Patricia Igwebuike dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka ná ntị ka ha na-erube isi n'ozuzuoke nye iwu na-achị okporoụzọ, iji hụ na e belatara oke ihe mberede na 'agbakata akwụrụ' a na-enwekarị n'okporoụzọ n'ime ọnwa mbà.
Banyere ọnọdụ okporoụzọ, o kwuru na ọchịchị ya ga-arụ ọrụ okporoụzọ karịrị kilomita puku iri na mpaghara ebe dị icheiche na steeti Anambra, ma mekwa ka a mara na ihe gbasara ọrụ okporoụzọ so n'otu n'ime ihe gbara ọkpụrụkpụ dị n'amụ̀mà ego ọrụ steeti Anambra nke afọ 2023; màkà na ọnọdụ nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga n'okporoụzọ na-emetụ ya n'obi, tinyekwuoro na ọ ghọtara mkpa ezi ọnọdụ okporoụzọ dị n'ibelata ihe mberede okporoụzọ nà agbakata akwụrụ.
Ọ dọ̀kwàzị̀rị̀ aka ná ntị megide mmadụ iku nwatakịrị n'aka maọbụ n'ụkwụ were anya ụgbọala, ma gwa ndị na-eme ihe dị otú ahụ ka ha sepu aka na ya.
Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi ụlọọrụ FRSC n'Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi mere ka a mara na mmadụ karịrị otu nde na ụma atọ na-anwụ n'ihe mberede okporoụzọ n'ụwa gbaa gburugburu kwà afọ ọbụla, ebe mmadụ isii na-anwụ kwà áwà ọbụla n'ime Africa n'ihi ihe mberede okporoụzọ, dịka mpụtara e wepụtara site n'aka ụlọọrụ ‘World Health Organisation’ (WHO) siri kọwaa.
Ọ gàkwàrà n'ihu kọwaa na okporoụzọ steeti Anambra nọ n'ọnọdụ nke iri na ise ugbua dịka okporoụzọ kacha jọọ njọ ugbua n'ala Nigeria, ọbụla ka ọ gàkwàrà n'ihu gbarie isiokwu mmemme ahụ nke afọ, nke bụ ‘Zeere Ịgba Oke Ọsọ, Ibu Oké Ibu, na Iji Ụkwụ Ụgbọala Adịghị Mma, Ka I Wee Laruo n'Udo’
Na ntụnye nke ya onyeisi ụlọọrụ FRSC na mpaghara RS5 (nke gụnyere steeti Anambra, Delta, na Edo), bụ ACM Chukwuma N. Njoku kwùrù na mmemme ahụ bụ otu n'ime atụmatụ ụlọọrụ FRSC wepụtara ma na-emekwa ya kwà afọ ọbụla, iji gbochie maọbụ belata ọnọdụ ihe mberede okporoụzọ mà kwàlité ezi nchekwa okporoụzọ na njem awele. Ọ dọ̀kwàzị̀rị̀ aka na ntị megide ịṅụ mmanya tupu nyaba ụgbọala, ịgba oke ọsọ, ịgbalitesi egwu ike, ibu oké ibu, iji ụkwụ ụgbọala adịghị mma ányà ụgbọala, tinyéré ihe ndị ọzọ nwere ike ibute Ihe mberede okporoụzọ.
Onye ọzọ kwukwara okwu na mmemme ahụ gụnyèrè Eze Ọdịnala Awka bụ Igwe Gibson Nwosu, nke onye nọchitere anya ya bụ Chiifu Nweze Okoli dọ̀kwàrà ndị na-anyà ụgbọala aka ná ntị ka ha zèére ịza òkù ekwentị mgbe ha na-anyà ụgbọala, ma gwakwa ha ka ha na-erube isi n'iwu na-achị okporoụzọ oge niile, n'abụghị naanị mgbe ha hụrụ ndị ọrụ FRSC.
Onye ọzọ méré ka mmemme ahụ daa ụda, ma bụrụkwa onyeisi ụlọụka ‘Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry’ bụ Onye amụma Chineke, Chukwuemeka Ohanemere (onye a maara dịka Odumeje) kèlèrè ndị ọrụ FRSC màkà ịchịkọ̀bà ọmarịcha mmemme ahụ, ya na ọrụ ha na-arụ ichekwa ndụ ụmụ mmadụ n'okporoụzọ, bụkwa nke o kwuru na ọ dabara adaba n'ọrụ nke ya dịka Onyeozi Chukwu, n'ihi na ya onwe ya na-azọkwa ndụ site n'inye aka Chineke, ma na-ekpekwara ndị na-eme njem ekpere maka ije awele.
Maazị Odumeje kwezị̀rị̀ nkwà ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ya na ndị ụlọọrụ FRSC, ọbụna dịka ọ dọ̀kwàrà ndị na-anyà ụgbọala aka ná ntị megide ihe ọbụla nwere ike ibute ihe mberede okporoụzọ n'ụdị ọbụla n'ime oge a, maka na ọ bụ eje ala bụ isi ije.
Mmemme ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti, ndịisi ụlọọrụ nchekwa dị icheiche, ndịisi ụka, ndịisi ọdụ ụgbọala dị icheiche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi na na ngalaba dị icheiche; ma bụrụkwazie mmemme a nọrọ na ya gbaa egwu ọdịnala, mee ihe ngosi dị icheiche, ma gbapekwazie atụmatụ nchekwa okporoụzọ ọnwa mbà kpọmkwem.
What's Your Reaction?






