Ọkàikpe Anambra atọhàpụ̀la ndị mkpọrọ iri na abụọ n'Aguata

Dec 1, 2022 - 07:17
 0
Ọkàikpe Anambra atọhàpụ̀la ndị mkpọrọ iri na abụọ n'Aguata

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ọǹụ na ite egwu ọṅụ dara n'ụlọ mkpọrọ ‘Medium Security Correctional Centre Aguata’, n'okpuruọchịchị ime obodo Aguata nke steeti Anambra, dịka Ọkàikpe steeti ahụ, bụ ‘Justice’ Onochie Anyachebelu tọhapụrụ̀ mmadụ iri na abụọ n'ime ndị a tụrụ nga n'ụlọ mkpọrọ ahụ, ma sị ha laba, dịka otu n'ime ọrụ na ikike ya dịka Ọkaikpe steeti ahụ.
 
Ndị ahụ a tọhapụrụ̀ ụbọchị ahụ gụnyèrè Onyebuchi Nkwo, Timothy Aluo, (sitere steeti Imo), Udo Onyinye (sitere Oko dị na steeti Anambra), Emmanuel Okonkwo (sitere Nawfija dị na steeti Anambra).

Ụfọdụ ndị ọzọ gụnyere Nzubechukwu Umekwuobi,  Chidiebere Okonkwo, Esomuchi Orjiakor, Echezona Okeke, Mmaduabuchi Udeh, Oluchukwu Anagboso na Chika Onuorah.

Akụkọ  kọrọ na ihe dị icheiche ndị ahụ mere e jiri kpọ̀chie ha ha gụnyèrè igbu ọchụ̀, izu ohi, or mmadụ, ma ihe ndị ọzọ.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ ka ọ tọhapụchara ndị ahụ, Ọkàikpe Anyachebelu kọwàrà na ihe ahụ bu nke onye Ọkaikpe ọbụla na-eme kwà afọ obụla, ma bụrụkwa nke nke na-enye aka n'ụzọ pụrụ iche iji belata ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n'ụlọ mkpọrọ

Ọ dụrụ ndị ahụ a tọhapụrụ̀ ọdụ ka ha gba mbọ kpachapụ anya ha ma na-ebizị ezi àgwà, ma gbasikwa mbọ ike ịbụ ndị ga-aba uru n'obodo.

 Na ntụnye nke ya, Osote Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ, Maazị Eke Eke kọwàrà na ọ ndị ahụ nọ n'ime ụlọ mkpọrọ ahụ, na a kuziiri ha ụdị ọrụ aka dị icheiche ga-enyere ha aka ịbara onwe ha na obodo ha uru, ọkachasị ugbua ha pụ̀tagoro n'ụlọ mkpọrọ. Ọ dụkwazịrị ndị ahụ na ha tinyesie ihe dị icheiche ha mụtara ebe ahụ n'ọrụ, ma gharakwa ịlaghachi azụ n'ajọ akparamagwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484