Ọgbụgba Ahọ Iri Isii: Ndị Mbaukwu Anabatala Ibezim n'Ụzọ Pụrụ Iche

Ọgbụgba Ahọ Iri Isii: Ndị Mbaukwu Anabatala Ibezim n'Ụzọ Pụrụ Iche

Izunna Okafor dere akụkọ a

Dịka otu n'ime mmemme o ji emerùbé ncheta ụbọchị ọmụmụ ya na ọgbụgba ahọ iri isii ya, Achbishọp mpaghara Niger na Bishọp ụka Anglịkan na Dayọsis Awka, bụ, Most Rev'd Alexander Chibuzo Ibezim, agọziela ala maka ịrụ nnukwu ụlọ ezumezu n'ụlọ akwụkwọ ‘St. Paul University Secondary School, Nibo-Nise’ dị n'okpuru ọchịchị Awka South nke steeti Anambra.

N’okwu ya na emume ahụ, Achbishọp Ibezim, onye kwuru na ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ebe a nọrọ mụọ ya, kọ̀rọ̀ akụkọ na ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ n’ebe ahụ oge ọ bụ nwata ka o loro okwuchi karama e ji agbanye mmiri, mana Chineke zọpụtara ya n'ihi nabe buuru ya n'ịnyịnyà igwe wee gaa Adazi-Nukwu ebe a zọpụtara ya site n'ọrụ ebube Chineke, n'agbànyeghị ụdị nnukwu ọbara gbara ya n'ahụ ụbọchị ahụ.

Ọ gara n’ihu gbaa ama maka nnukwu ihe ndị ọzọ Chineke meere ya site n’oge ọ bụ nwata ruo n’oge ọ bụ okenye, bụ nke o kwuru na ha sokwa n’ihe mere o ji chọọ ịrụ nnukwu ụlọ nzukọ ahụ, iji nye Chineke otuto.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Bishọp Joseph Musa nke Dayọsis Idah (steeti Kogi), onye kọwara mmemme ahụ dịka ihe dị ịrịba ama na ncheta, kwuru na ebe ọmụmụ na ebe e liri mmadụ bụ ebe abụọ pụrụiche ma dịkwa ncheta na ndụ mmadụ, chètààrà ndị otu Kraịst mkpa ọ dị mmadụ ịchọpụ̀ta ihe e ji mụọ ha, na icheta ebe o si malite.

N’ozi ekele ya nyégárá Achbishọp n’ọgbụgba ahọ iri isii ya, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ ụkọchukwu Joseph Onyibor bụ onye Achbishọp buliri n'ọkwa ‘Canon’ ụbọchị ahụ, kwupụtara obi ụtọ ya na obi ekele ya maka nke ahụ; ọbụladị dịka o kelere Chineke maka ndụ nke Achbishọp Ibezim, ma kpekwa ka Chineke gọzie ije ozi ya.

Ka ọ gbapechara ma kirichaa asọmpi egwuregwu bọọlụ n'etiti ndị ụkọchukwu dayọsis ahụ na n'etiti ụmụ akwụkwọ Agulu Grammar School na Comprehensive School, Nawfia n'ụlọ akwụkwọ ahụ; Acchbishọp Ibezim, toro ma nyekwa ndị sonyere n'asọmpi ahụ nnukwu nkwado pụrụ iche, ma nọrọkwazie ebe ahụ kwupụtakwara nguzobe nke ‘Awka Football Academy’ nke dayọsis, mekwa ka a mara na a ga na-emezị asọmpi bọọlụ ahụ kwà ahọ ọbụla.

Archbishọp na ndị ya na ha so mèchààrà si ebe ahụ gaba Mbaukwu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Awka South, bụ ebe ọ nọrọ gbapee ma lelee ihe dị icheiche ụmụakwụkwọ ụmụakwụkwọ Renaissance Modern Polytechnic, Mbaukwu (bụ ụlọakwụkwọ dayọsis ahụ nwe) rụpụtara; gaa leta ili nne na nna ya n'ulo ezinulo ya; ma gaakwa leta eze ọdịnala Mbaukwu, bụ H.R.M. Igwe Peter Anagwu (Eze Ukwu na Mbaukwu) n'obi ya.

Mgbe ọ na-ekwu okwu n'obí Igwe Mbaukwu, Achbishọp Ibezim kọpụtasịrị ụfọdụ n'ime ọtụtụ nkwado eze ọdịnala ahụ nyere ya n'oge gara aga, malite n'oge ọ bụ naanị ụkọchukwu ruo ugbu a ọ bụ Achbishọp, nke gụnyere ịzụrụ ya uwe ndị ụkọchukwu na ihe ndị ọzọ; ma kwukwa na ọ bụ ihe ndị ahụ kpaliri ya ịbịa kwanyere ya ùgwù ekele.

Achbishop Ibezim nyere Igwe ahụ otu ehi iji kelee ya, ma kpekwara ya ekpere maka ezi ahụike na ngọzị Chineke n'isi ya, n'isi ndị ọ na-achị, nà n'ala ahụ dum.

Na nzaghachi ya, Igwe Anagwu, bụ Igwe nke abụọ kachagoro nọọ n'ocheeze dịka Igwe n'Anambra (ma e wezuga Igwe Kenneth Orizu nke Nnewi) gbàrà àmà na Mbaukwu ewepụtala ọtụtụ ndị ama ama na mba ụwa, nke gụnyere Achbishop Ibezim; osote aka na-achị steeti ahụ ugbua, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim; K.O. Mbadiwe; tinyere ndị ọzọ.

Mgbe ọ na-akọwa na ọrụ ya, nkwado na ọchịchị n'ime obodo amaghị oke okpukperechi maọbụ ụka; Onye eze ahụ kpekwàrà ekpere maka udo na ọganihu obodo ahụ, ma gọzikwa Achbishọp Ibezim, ezinụlọ ya na ije ozi ya.

Na ntụnye nke ya, eze ọdịnala Awka bụ Igwe Gibson Nwosu, bụ onye Igwe Anagwu gwara ka ọ bịa mmemme ahụ nọ̀kwàrà ebe ahụ kọọ akụkọ etu Achbishọp Ibezim si bịa emume Ofala ya n'ọnwa Disemba afọ gara aga, n'agbanyeghị na ọ bụ ụkọchukwu Anglịkan ebe ya onwe ya bụ onye ụka Katọlik. Ya mere, o nyèkwazị̀rị̀ Archbishọp Ibezim otu ehi ka ọ bụrụ onyinye ncheta ụbọchị ọmụmụ, ebe ahụ na Mbaukwu.

Mmemme ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị mmadụ, nke ginyy nwunye Achbishọp, bụ Oriakụ Martha Chioma Ibezim; osote onyeisi otu Ọhaneze Ndigbo, Maazị Damian Okeke-Ogene; ndi ichie Mbaukwu, ndi isi uka na diocese ahụ na ndi nwunye ha, tinyere ọtụtụ ndi ozo.

A nọkwazị̀rị̀ na ya bụ mmemme wee bụọrọ Achbishọp Ibezim abụ ncheta ụbọchị ọmụmụ, tinyere ọtụtụ erimeri e riri ụbọchị ahụ na mmanya dị icheiche e jiri gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.