Obi Ndị Mmadụ, Dịka Ndị Omekoome Gbàrà Ụlọọrụ INEC Abụọ Ọkụ n'Ebonyi

May 21, 2021 - 20:57
May 21, 2021 - 20:58
 0
Obi Ndị Mmadụ, Dịka Ndị Omekoome Gbàrà Ụlọọrụ INEC Abụọ Ọkụ n'Ebonyi

Izunna Okafor dere akụkọ a


N'iji gbakwụnyekwuo na nsogbu na ihe ọdachi dị iche iche na-adapụtasị na mpaghara ebe dị iche iche na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ndị omekoome ámághị ndị ha bụ, nọrọ na nsonso a wee mụnye ọkụ n'ụlọọrụ abụọ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC), na steeti Ebonyi; ọkụ wee gbarikọọ ụlọ abụọ ahụ na ihe dị n'ime ya.

Ụlọọrụ abụọ ahụ a gbara ọkụ n'abalị ụbọchị Tuzdee dị na mpaghara okpuru ọchịchị 'Ezza North' nke steeti ahụ, ma bụrụkwa nke mere ka ọ fọdụrụ awà olenaole ka a malite ọgbakọ ndịisi ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ nchekwa chọrọ inwe ụbọchị Wenezdee banyere mwakpo ndị omekoome na-awakpò ụlọọrụ INEC.

Ndị ọnọmgbeomere mèrè ka a mara na ọkụ ahụ gbarikọrọ ụlọọrụ abụọ ahụ gwoogwoo, ma gbapịa akwụkwọ dị iche iche dị oke mkpa na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ebe ahụ.

N'okwu nke ya banyere nke ahụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ INEC na steeti Ebonyi, bụ Maazị Cornelius Ali, gbàrà akaebe na ndị omekoome gbara ụlọọrụ ha ọkụ n'ezie, ma kwuo ebe o doro anya, na ọkụ ahụ gbarikọkwara ụlọ igwe ọkụ ha na igwe ọkụ dịgasị n'ebe ahụ, ihe e ji atụ akwụkwọ (bụ 'cubicle'), tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

O mere ka a mara na ndịisi ụlọọrụ ahụ agaala ebe ahụ ya bụ ihe mere iji were anya ha hụ ka ọnọdụ mbibi ahụ siri gbata kwụrụ, ma kwuo na o weghị onye nwụrụ maọbụ nweta mmerụahụ site n'ọkụ ọgbụgb ahụ.

Dịka ọ na-akatọ akaọrụ na arụrụala ndị omekoome ahụ, Maazị Ali kọwàkwàrà na ajọ ọdachi ahụ bụụrụ ha nnọọ nnukwu ihe iche aka mgba, n'ihi na nke ahụ nwère ike imetụta maọbụ gbochie atụmatụ ndebanye aha n'akwụkwọ ahụ ụlọọrụ INEC na-achọ ịmalite mebe n'ọnwa Juunu ahọ a maka ndị ga-abịa ịgbara akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ.

Ọkụ a gbara ụlọọrụ INEC abụọ a n'Ebony mèzịrị ka ọ dị mkpọkụta ọnụọgụgụ ụlọọrụ INEC iri abụọ na atọ (23) ọkụ ọgbụgba mètụtagoro na nsosnso a na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria, nke ọkanọnụọgụgụ n'ime ha bụ ndị a gbara ọkụ site n'aka ndị omekoome.

Ọ dị ncheta na ndị omekoome a amaghị ndị ha bụ nọkwàrà ụbọchị ụka wee wakpò ụlọọrụ INEC dị na steeti Enugu, bụ ebe ha nọrọ wee gbaa ụgbọala INEC isii ọkụ, bibie abụọ ọzọ dịgasị ebe ahụ, tinyere ọtụtụ ajọ ihe ndị ọzọ ha mere  n'ụlọọrụ ahụ.

Ihe ọdachi ndị a nà ọtụtụ ndị ọzọ na-adakwàsa ụlọọrụ INEC na mpaghara ebe dị iche iche na nke ikpeazụ a mèzịrị onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma banyere ụlọọrụ ahụ n'ala Nigeria, bụ Maazị Festus Okoye jiri gbarụọ ihu ma gosipụta mgbakàsị ahụ ya banyere nke ahụ, bụ nke o kwuru na o nwekwara ike ibì ụlọọrụ ahụ aka ọjọọ n'ịkwado maka nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n'ala Nigeria n'ahọ 2023, ma ọ bụrụ na kwụsịghị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484