Ọbá Akwụkwọ Anambra Emeela Emume Ụbọchị Mgbochi Ịkwụ Ụdọ na Mba Ụwa

Ọbá Akwụkwọ Anambra Emeela Emume Ụbọchị Mgbochi Ịkwụ Ụdọ na Mba Ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

 A kọwaala mmadụ ịkwụ ụdọ (igbu onwe ya) dịka ihe arụ mmadụ kpachapụrụ anya mee, megide Chineke, megide onwe ya, ma megidekwa ndị dị ndụ. 

Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na steeti Anambra, bụ Sir Paul Nwosu bụ ya kwuputara nke a na mmemme otu ụbọchị nke ndị Ọba Akwụkwọ Steeti Anambra chịkọ̀bara, iji merùbe emume Ụbọchị Mgbochi Ịkwụ Ụdọ na Mba Ụwa, (bụ World Suicide Prevention Day) nke ahọ 2022. 

N'okwu ya na mmemme nke weere ọnọdụ ogige Ọbá Akwụkwọ ‘Prof. Kenneth Dike State Central E-Library’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra; Sir Nwosu kọwàrà na ozi sitere na Òtù Ahụike Mba Ụwa (World Health Organisation, WHO) na-egosi na ihe karịrị mmadụ 703,000 na-egbu onwe ha kwa afọ ọbụla; ebe, maka onye ọ bụla gburu onwe ya, e nwere ihe dị ka mmadụ 20 ndị ọzọ na-agbalịkwa igbu onwe ha, tinyéré ọtụtụ ndị ọzọ na-eche echiche igbu onwe ha. 

Ka ọ na-akọwa isiokwu mmemme ahụ nke afọ a, bụ "Inye Olileanya site n'Omume", Kọmịshọna ahụ kwukwara mkpa ọ dị ịkwàdò okwu site n'omume na ihe enyemaka oge ọbụla a na-agba mbọ izọpụta ndị dara mbà n'obi maọbụ ndị na-eche echiche banyere nsogbu ụfọdụ nwere ike ime ka ha gbuo onwe ha, karịa naanị inye ha ndụmọdụ na nkasiobi okwu ọnụ.

Ọ dụkwara onye ọbụla na-eche echiche igbu onwe ya ọdụ ka ọ gakwuru dọkịta, ndi ọkachamara, maọbụ ndị ọzọ nọ ya nso, kọwaara ha ka o siri dịrị ya, ka o wee mara ebe ọ ga-esi nyere aka, karịa ịgba nkịtị gbuo onwe ya n'efù, maka na mmadụ igbu onwe ya abụghị ọkachamma.

Ka ọ na-ekele Ọba Akwụkwọ Steeti ahụ maka ịhazi mmemme ahụ, Kọmishọna ahụ, onye bụkwa onye ọbịa pụrụiche na mmemme ahụ, kpọkùrù gọọmentị ka ha kwalite ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ iji belata ihe isi ike na ntaramahụhụ, nke, o kwuru na ha sòkwà n'ụfọdụ na-eme ọtụtụ ndị mmadụ ji egbu maọbụ na-eche echiche igbu onwe ha.

Na mbụ n'okwu nnabata ya, Onyeisi Ọba Akwụkwọ Steeti Anambra bụ Dọkịnta Nkechi Udeze kwuru na mmemme ahụ bụ nke ha na-achịkọ̀ba kwa afọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji kwàlité ịgbasàwànyè ozi megide mmadụ igbu onwe ya. Ọ kpọrọ òkù ka e jikọọ aka ọnụ ma gbasie mbọ ike iji gbochie mmadụ igbu onwe ya, bụ́ nke o kwuru na ọnụọgụgụ ya na-abawanyezị ụba kwà ụbọchị.

Dọkịnta Udeze kpọ̀kwàrà òkù ka e guzobesie ogige pụrụ iche a gaghị etinye okwu 'Psychiatric' n'aha ha, ka ndị mmadụ dara mbà n'obi na ndị nwere nsogbu dị aṅaa nwee mmasị na mkpali iji obi ha g aa ebe ahụ maka nleruanya, maka na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ekwekarị aga ogige ebe nwere okwu ‘Psychiatric’ n'aha ya, n'ihi na ha na-ahụta ya dịka ogige e mebere maka ndị ara na ndị nwere isi mgbaka.

Na nkụzi nke ya na mmemme ahụ, Onyeisi ogige nlekọta ahụike ‘At Peace Centre and Clinics’, Dọkịnta Casmir Nnaemeka kọwara na mmadụ igbu onwe ya nwèrè ọtụtụ ihe jikọrọ ya na ọrịa uche, n'ihi na onye anaghị arịa ọrịa uche enweghị ike iche echiche igbu onwe ya. Ọ kọwapụtara ọnọdụ uche dị icheiche na ọnọdụ ndị ọzọ nwere ike ime ka mmadụ malite iche echiche igbu onwe ya, ma nyekwara onye ọbụla na-ahụta ihe dị otú ahụ ndụmọdụ ka ọ gaa kpọtụrụ ndị ọkachamara nwere ike inyere ya aka; ọbụna dịka ọ kpọkuru ndị ọkachamara na-ahụ maka ilekọta ndị dị otú ahụ ka ha na-agbaso ma na-erube isi mgbe niile na ụkpụrụ omume na-achị ọrụ ha, ọkachasị dịka o siri metụta ijide ire ha aka, iji zèére ime ka ọnọdụ onye ahụ kawanye njọ. 

Dịka otu n'ime ntụnye nke ha iji gbochie igbu onwe onye ya, ​​Dkt. Nnaemeka, onye jikwa onye na-ahụ maka mgbasaozi nà mmekọrịta ọhaneze n'òtù ‘Nigeria Psychological Association (NPA) kwupụtara na ụlọọrụ ya bụ ‘At Peace Center and Clinics’, site na njikọaka ya na ‘Prof. Andrew Zamani’, nà ndị òtù ‘Nigerian Psychological Association’ ga-enye mmadụ otu narị n'Anambra Steeti onyinye ọrụ ndụmọdụ n'efu, iji belata mmadụ igbu onwe ya. O kwuru na ndị nwere mmasị nà nke ahụ nwèrè ike ịga n'ụlọọrụ ‘At Peace Centre na Clinics’ dị na No.4 Emma Nnaemeka Street, Awka; ịga n'isi ụlọọrụ ABS dị n'Awka, maọbụ ịga n'isi ụlọọrụ Ọbá Akwụkwọ Steeti Anambra bụ ‘Prof. Kenneth Dike State Central e-Library, Awka’, iji kwupụta mmasị ha ma debanye aha ha banyere nke ahụ.

N'akụkụ nke ya, onye mgbasa Ozi Ọma, bụ Oriakụ Ifeoma Godspower nke ụlọekpere ‘Godspower World Outreach Ministry, Awka’, gbàdòrò ụkwụ n'ebe ụfọdụ n'Akwụkwọ Nsọ wee kwuo na ihe na-akpata mmadụ igbu onwe ya bụ echiche ọjọọ nke Ekwensu na-etinye n'obi mmadụ, ọkachasị oge onye ahụ amaghị Chineke na Okwu Nsọ n'ozuzuoke.

Dị ka o siri kwuo, Kraịst n’onwe Ya dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na a ga-enwe mkpagbu na ahụhụ n’ụwa, mana ọ gwaghị ha ka ha gbuo onwe ha mgbe ha malitere ịhụta ụdị ihe dị otú ahụ. 

Ya mere, Oriakụ Godspower gàrà n'ihu kpọpụ̀ta mmadụ ịma okwu Chineke nke ọma, mmadụ inwe okwukwe siri ike na olileanya na Chineke, nà mmadụ iche obi ya nche, dịka ụfọdụ ụzọ mgbapụ̀ mmadụ nwere iji gbanahị iche echiche ọjọọ nwere ike ibute igbu onwe ya. O mèkwàrà ka a mara na Chineke dị njikere mgbe niile izọpụta ndị weere ntụkwasịobi na itinye olileanya ha tinye n'ime Ya, n'agbanyeghị otú ọ sọrọ ọnọdụ ha dị. 

Ihe omume ndị mmadụ bịara n'ùjú bụkwa nke a nọrọ na ya nwee oge ajụjụ na azịza, bụọ abụ maka ịkwụ ụdọ, ma mekwa ihe ngosi ejije gbasara mmadụ igbu onwe onye, bụ ​​nke e mere site n'aka ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ‘Candy International School, Awka’. 

Kemgbe a malitere ya n'ahọ 2003, Mmemme Ụbọchị Mgbochi Ịkwụ Ụdọ bụ nke a na-eme n'abalị iri nke ọnwa Septemba ahọ ọbụla n'ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụkwa nke ndị òtù ‘International Association for Suicide Prevention (IASP)’ haziri site na nkwàdó Òtù Ahụike Mba Ụwa (WHO), iji kwalite gbasaa ozi n'ụwa gbaa gburugburu megide mmadụ igbu onwe ya n'ụdị ọbụla.