Ọba Akwụkwọ Anambra Achịkọbala Ọgbakọ Izugbe Maka Ndị Ndu Ọba Akwụkwọ Ohaneze

Nov 25, 2020 - 16:12
Jan 30, 2021 - 16:12
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Achịkọbala Ọgbakọ Izugbe Maka Ndị Ndu Ọba Akwụkwọ Ohaneze

Izunna Okafor

A kọwaala ọba akwụkwọ ọhaneze dịka nke nwere nnukwu ọrụ pụrụ iche dịịrị ya n'imezùpụta ebumnobi ọkpụtọrọkpụ pụrụ iche nke otu mba ụwa United Nations wepụtàrà, bụ nke a maara na bekee dịka 'Sustainable Development Goals (SDGs)'.

Onyeisi mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, bụ Ọkammụta Charles Okechukwu Esimone bụ ya kpọrọ oku a na mmemme abalị abụọ, a kpọrọ "Conference of National Librarian, Chairman And Directors of State Public Library Boards In Nigeria" bụ nnukwu ọgbakọ izugbe nke ndị ndu ọba akwụkwọ ọhaneze dị iche iche n'ala Nigeria na-enwe kwà ahọ ọbụla.

Ya bụ mmemme nke isiokwu ya bụ "Ọrụ Dịịrị Ọba Akwụkwọ Ọhaneze n'Imezùpụta SDGs" bụ nke ọ bụ ọba akwụkwọ steeti Anambra chịkọbara, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọ ezumezu ọba akwụkwọ ahụ dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

Ọkammụta Esimone, onye bụ onyeisi oche na mmemme ahụ, ma bụrụkwa onye Ọkammụta Nkechinyere Nwokoye nọchitere anya ya na mmemme ahụ, kọwàrà na ọba akwụkwọ nwèrè nnukwu ọrụ dịịrị ya, n'ihi na ọ bụ n'ọba akwụkwọ ka ndị mmadụ ga-ahụ ma gụọ akwụkwọ dị iche iche ma nwetakwa ozi na ọgụgụisi ha kwesiri inweta iji tụnye ụtụ nke ha ma mekwa ihe a tụrụ anya n'aka ha n'imezùpụta ya bụ SDGs.

N'ozi nnọọ ya, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kọwara ọba akwụkwọ ọhaneze dịka mahadum ọha mmadụ, bụ ebe mmadụ ọbụka pụrụ ịga gụọ akwụkwọ ma nwetakwa ọgụgụisi na mmụta n'efu, n'agbànyèghị okpukperechi, ogoogo onye ahụ maọbụ ọnọdụ ya n'obodo.

Ọ kpọpụtasịrị ihe iche aka mgba dị iche iche na-echere ọba akwụkwọ ọhaneze taa, ma kpọọ oku maka nkwàdo na mnwògharị ọba akwụkwọ ọhaneze, iji nyere ha aka iguzoro nke ọma ma rụọ ọrụ dị iche iche chere ha n'ihu, dịka o siri metụta imezùpụta SDGs. Ọ kpọkukwazịrị ndị ndu ọba akwụkwọ ọhaneze dị iche iche ka ha bilie ma rụọ ọrụ ha nke ọma n'ihi na oge agaala mgbe ndị ndu ọba akwụkwọ na-anọ otu ebe n'ụlọọrụ ha ma na-eche ka ndị mmadụ chọrọ ha bịa.

Na mbụ oge ọ na-agbape mmemme ahụ, onyeisi ọba akwụkwọ n'ala Nigeria, bụ Ọkammụta Lenrie O. Aina mere ka a mara na ebumnobi ọgbakọ ahụ bụ iji mee ka ndị ndu ọba akwụkwọ ọhaneze mara ọrụ dịịrị ha n'imezúpụta SDGs, ma mụtakwa ụzọ ha ga-esi rụọ ya bụ ọrụ, iji mezùpụta ya bụ ebumnobi ọkpụtọrọkpụ, bụ nke ndị ndu mba ụwa wepụtara n'ahọ 2015.

O kelekwara steeti Anambra maka ịnabata ha na ile ọbịa na mmemme ahụ nke ahọ a, ya na nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ọba akwụkwọ ọhaneze na steeti ahụ. O kwukwazịrị na ha ga-anọ n'ọgbakọ ahụ wee tụọ aro banyere ịrụ ngalaba ọba akwụkwọ ala Nigeria n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

N'okwu ya na mmemme ahụ dịka onye ọbịa pụrụ iche, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Maazị Mike Okonkwa nọchitèrè anya ya, mèrè ka a mara na agụmakwụkwọ so n'otu ihe kacha echu ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ ụra, bụkwazị nke mere o ji akwàdo ya nke ọma.

O kwuru na ọ bụ n'ọba akwụkwọ ahụ ka ọchịchị steeti ahụ nọrọ wee gbapee ma malite amụmà ịkụ osisis na mpaghara gburugburu niile nke steeti ahụ, ma mekwa ka a mara na gọọmenti steeti ahụ na-achọkwa ọba akwụkwọ ahụ mma n'oge ekeresimeesi ahọ ọbụla. O kwezịrị nkwà na gọọmenti ga-aga n'ihu ịkwàdò ọba akwụkwọ ọhaneze na steeti ahụ.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba mere ka a mara na gọọmenti steeti ahụ na-amà amụmà ime ka ọba akwụkwọ steeti ahụ bụrụ ọkachamma na mba Afrika.

N'okwu ha n'otu n'otu onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Maazị Harry Uduh nke ọ bụ Maazị Godson Ifeanyi nọchitere anya ya; nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ sekọndịrị, Dọkịta Paul Ifeanyi; ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na minịstịrị mgbasaozi na steeti ahụ n'oge mbụ, bụ Maazị Dike Ndulue, kọwàrà ọba akwụkwọ dịka ụlọọrụ dị oke mkpà n'obodo ọbụla, ma kpọọ oku ka onye ọbụla nye aka ịkwàdò ya ka o wee nwee ike ịrụ nnukwu ọrụ ahụ chere ya n'ihu.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Advertising Agency (ANSA)' bụ Maazị Jude Emecheta mèrè ka a mara na ya na-aga n'ọba akwụkwọ ahụ agụ akwụkwọ na mgbe na mgbe, ma kpọkwa oku ka e meekwa ya bụ ọba akwụkwọ ka ọ dị n'usoro dijitalụ, ka ndị mmadụ wee nwee ike ịdị na-agụ akwụkwọ na ya site na mpaghara ebe ọbụla ha nọ.

Na ntụnye nke ya, osote onyeisi ọba akwụkwọ ala Nigeria, bụ Dọkịta Uju Nwafor-Orizu kpọkuru ndị ndu ọba akwụkwọ ka ha na-emepụta ihe a hụrụ anya na gburugburu na steeti ebe ha na-arụ ọrụ, bụ nke ga-eme ka ihe gbasaara ọba akwụkwọ na-amasị ma na-adọta ndị mmadụ; ha ewee si n'ụzọ dị etu ahụ rụzùpụta ọrụ dịịrị ha n'ihe gbasaara SDGs.

A nọrọ na mmemme ahụ wee nye nkụzi dị iche iche dabàrà n'isiokwu mmemme ahụ, bụ nke nke e nyere site n'aka Nkem Osuigwe, Dọkịta Airen Adetimirin, Oriakụ Neemat Days Abdulrahmim, na Dọkịta Ezra Shiloba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.