Nwoke Na Enyi Ya Nwaanyị Ejirila Mma Gbukaa Nwunye Ya

Nwoke Na Enyi Ya Nwaanyị Ejirila Mma Gbukaa Nwunye Ya

Chinwendu Uzoatu

Otu nwaanyị aha ya bụ Wakego, nọ n'oke ihe mgbu ugbua n'ụlọọgwọ University of Port Harcourt Teaching Hospital (UPTH), steeti Rivers, n'ihi mmà di ya na enyi ya nwaanyi gburu ya.
  Di ya, Chima ka e kwuru na ya na enyi ya nwaanyị  wakporo ma gbuo ya mma ọtụtụ ugboro n'Omerelu nke dị n'okpuruọchịchị Ikwere nke steeti Rivers, oge Wakego jekwuru di ya iji chọpụta ihe o jiri kpọlata enyi ya nwaanyị ụlọ.
 Nwanne nwaanyị ahụ e gburu mma, Maazi Anayo Warisi sị: "Di nwanne m nwaanyị kpọlọtara enyi ya nwaanyị ụlọ, nwunye ya wee bịakwute ya ịchọpụta ihe o jiri kpaa àgwà ahụ. Di ya na enyi ya nwaanyị malitere tibe ya ihe, ebe e kwuru na di ya butere mma gbuo ya ahụ niile, mana nke e gburu ya n'ụkwụ kacha njọ. 

  “Nwanne m nwaanyị nke nnukwu na nwanne m nwoke buru ya gaa ụlọọgwụ dị n'Elele, ma a nabataghị ya, n'ihi ụlọọgwụ ahụ kwuru na ọnya áhụ̀ dị̀ égwù, ma nye ntụziaka ka e buru ya gaa UPTH. 

  “Anyị chọrọ ka a nwụchikọọ di ya n'ihi na ihe merenụ bụ mmadụ ịchọ ka o gbuo ọchụ. Anyị na-echè na ebumnuche ya bụ ka o gbuo nwanne anyị nwaanyị."
  Ka ọ dị ugbua, Gladys Oyenmwen, bụ Odeakwụkwọ òtù Centre for Basic Rights Protection and Accountability Campaign akpọọla oku ka e mee ezi nyocha n'okwu ahụ ma mee onye ọbụla aka ya dị na ya, ihe iwu kwuru.
 Oge ozi ruru anyị aka, okwuptaokwu ndị uweojii na steeti ahụ, SP Grace Iringe Koko, kwuru na ndị uweojii Elele Police Division anwụchikọọla enyi nwaanyị nwoke ahụ, ebe Kọmishọna uweojii steeti ahụ, Eboka Friday nyerela iwu ka a hafee okwu ahụ n'aka ngalaba, State Criminal Investigation and Intelligence Department (SCIID), Port Harcourt.