Nwoke Ekwulọbịa Aragbuola Atụrụ n'Ọhịa

Jul 26, 2022 - 07:15
 0
Nwoke Ekwulọbịa Aragbuola Atụrụ n'Ọhịa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ nnukwu ihe ejije pụrụ iche na nsonso a, dịka ndị obodo mànyèrè otu nwaokorobịa ka ọ taa anụ atụrụ nwụrụ anwụ na ndụ ma susukwa ozu atụrụ ahụ ọnụ.

Nke a bụ nke mere n'Ekwulọbịa dị n'okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra na nsonso a, ma bụrụkwa nke a manyere nwoke ahụ ka o mee n'ihi na a na-ebo nwoke ahụ ebubo na ọ gbara nne atụrụ n'ime ọhịa.

Dịka akụkọ siri kọọ, bụkwa nke onyoonyoo ya na-efegharị ugbua n'uzoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, nwoke ahụ, bụ Maazị Onyedika Ezennaya jidèrè otu ọmarịcha nne atụrụ mara abụba, wee kpọrọ ya baa n'ime ọhịa, wee nọrọ ebe ahụ rie ya ọkọmbọ ihu na azụ.

Ka ọ pịachara nne atụrụ ahụ ọkụ ka ọ gbara gụọ ya, ọ hapụrụ ya, wee jide nwa ya, chọkwa ka ọ pịa ya ọkụ. Kaosiladị, nwa atụrụ ahụ ekweghị enye ya ihe ọ chọrọ; nke mezịrị ka o jiri iwe gbuo ya bụ atụrụ, ma gbajisie ya aka na ọkpa, tụhapụ ozu ya n'ime ọhịa ahụ.

Ọ bụzị oge ọ na-eme ihe ndị a ka ndị mmadụ hụrụ ya, e wee nwụchikọọ ya, kụọ ya ihe tinka kụrụ paanụ, tupu o bido saba asịsà ozigbo.

Nke a mezịrị ndị nwe atụrụ ahụ o gburu egbu jiri wee iwe, wee jide ya n'ime ọhịa ahụ, sị ya na ọ ga-esusu nwa atụrụ ahụ nwụrụ anwụ ọnụ, ma takwa anụ ya n'esighị esi.

Ha katọkwara ihe ahụ nwoke ahụ mere dịka nnukwu nsọala n'obodo ahụ, ma na-etikwa ya ihe oge ahụ a na-amanye ya ka ọ taba anụ atụrụ ahụ nwụrụ anwụ; ebe ya onwe ya na-arịọkwa biko ka a gbaghara ya.

N'okwu ya oge a kpọtụụrụ ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu nyere ndị ahụ ndụmọdụ ka ha kpọrọ ya bụ nwoke gaa n'ogige ndị uweojii dị ha nso ka e wee leba anya n'okwu ahụ, mee nnyocha banyere ya, ma nyekwa ya ntaramahụhụ kwesiri ya, dịka ọ dị n'usoro iwu.

Files

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484