Nwaanyị Na-Enwe Oke Afọ Mgbu Amụọla Nwa n'Ụlọ Mposi n'Amaghị Na Ọ Dị Ime

Nwaanyị Na-Enwe Oke Afọ Mgbu Amụọla Nwa n'Ụlọ Mposi n'Amaghị Na Ọ Dị Ime

Nkechi Ikenwoke 

Otu nwaanyị onyeọcha gbara ahọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Lucy Jones amụọla nwa ọhụrụ n'ime efere mposi dị ihe dịka fiiti abụọ n'omimi ya oge ọ chọrọ iji mmiri kpochapụ mposi ya, sị na ya amaghị na ya dị ime ọmụmụ.

N'oge a na-agba ya ajụjụọnụ, Lucy Jones kwuru na ya na arụ ọrụ ịkwọ ụgbọelu ma kwukwa na ya tụrụ anya na ọ bụ oke afọ mgbu ya malitere ime ya kpatara o jiri gaa mposi, n'ihi na ọ bụ etu ahụ ka o siri mee oge gara aga n'ọnwa Machi ọ hụchara nsọ ya.

Jones gara n'ihu kwuo na afọ ya tụgharịrị n'ụtụtụ ụbọchị ahụ oge o dina n'àkwà ya, nke mere o ji were ọsọ gbabaa n'ụlọ mposi ahụ n'amaghị na ọ bụ ime na-eme ya. O kwukwara na mkpọtụ ọ nụrụ oge ahụ mere ya ji lee anya n'ime efere mposi ma hụ nwa ọhụrụ ahụ.

Ya bụ nwaanyị kọwàrà na oke egwu jidere ya oge ọ chọpụtara ihe mere n'ihi na ya ahụghị ihe ngosi ọbụla maọbụ tụọ anya ịmụ nwa ọhụrụ, maka na ọ ka na-ahụ nsọ ya kwa ọnwa ọbụla tupu ihe ahụ mee.

Jones kwuru na ya gara nnyocha n'ụlọ ahụike mgbe ya dị ihe dịka ime ọnwa asatọ ma bụrụ oge afọ mgbu ya malitere nke ukwuu, mana nnyocha afọ ahụ egosighị na ya di ime maọlị. Ọ gara n'ihu kwọwaa na ya na-arụ ọrụ ihe dịka áwà iri asaa n'izuụka, na-aṅụ mmiri oge ọbụla ma gbaa klọb ya ugboro iri na ise n'ọnwa tinyere nke abalị atọ ọ gara tupu ọ mụọ nwa.

Oge nwa ya ahụ ọ gụrụ aha dịka Ruby gbara ọnwa anọ, Jones kwuru na ọnọdụ ọmụmụ nwa ya dịnnọọ ka ọbọgwụ nọ n'ime mmiri.

Mgbe onyeọcha ibe ya bụ Bristol gbara ya ajụjụọnụ, Jones sịrị: “Enweghị m ihe ngosi ọbụla dịka ahụọkụ. Afọ m ebughị ibu. Ana m ahụkwa nsọ m kwa ọnwa ọbụla.

"Na mbụ, ọ dịghị nnyocha gosiri na m dị ime. Dọkịnta bekee pịrị m aka n'afọ nke ukwuu wee kwuo na adịghị m ime. Aṅụọla m mkpụrụọgwụ maka afọ m ihe ruru afọ asaa maọbụ karịa. Agara m ọrụ ọzụzụ abalị abụọ ma nwete asambodo ịnya ụgbọelu otu ọnwa tupu mmụa nwa."

Ọtụtụ ndi mmadụ kọwara na Jones nwere ihe ndi bekee kpọrọ "Cryptic Pregnancy" nke pụtara ime nzuzo n'asụsụ Igbo ma bụrụ nke nwaanyị agaghị achọpụta wee ruo mgbe ọ mụrụ nwa. Nke a pụtara na ọ bụghị ime ana ahụ oge ọbụla.