N'Ụmueri, Igwe Ben Emeka Agbaala Ọvala Nke Isii

Izunna Okafor dere akụkọ a
Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a n'obodo Ụmụeri dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anambra East nke steeti Anambra, dịka eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Ben Emeka mèrè emume ịgba ọfala ya n'ụzọ pụrụ iche, bụkwa nke o jiri merùbe afọ isii o jiri banye n'ọkwa dịka eze ọdịnala obodo ahụ.
Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'òbí eze ọdịnala ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ndị òtù dị icheiche, ndị ichie na ọtụtụ ndị ọzọ sikwa ebe dị icheiche wee bịa isonye na ya.
N'okwu ya n'ebe ahụ, Igwe Chidume kwupụtàrà obi ụtọ ya, ma nyekwa Chineke ekele maka ọrụ ọma dị icheiche o ji ya arụ n'obodo ahụ kemgbe afọ olenole gara aga, ma kelekwazie ụmụafọ obodo ahụ maka ezi nkwàdo ha na ekpere ha nyegara ọchịchị ya, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ.
O mere ka a mara na obodo ahụ bụ ndị na-akọsi ọrụ ugbo ike, bụkwa nke e jiri mara ha n'ụwa gbaa gburugburu, tinyere omenala na ọdịnala dị icheiche e jiri mara ha, nke ha sikwa na ha wee na-akwalite ọnatarachi na njirimara ndị Igbo
Dịka ọ na-akpọpụ̀tasị ụfọdụ ihe dị icheiche ndị obodo ahụ jikọgoro aka ọnụ wee mepụta iji kwalite mmepe na ọdịmma obodo ahụ; ọ gàkwàrà n'ihu wee kwuo na ọ gaghị ada mbà inye ụmụafọ ahụ ezi ọchịchị bụ ịgbà site n'inye aka ha, nkwàdo nà ekpere ha. O kwukwàrà na ha na-etinyezị anya ugbua n'ihe gbasara ịkwàlite agụmakwụkwọ, ọkachasị agụmakwụkwọ ụmụaka ụmụnwaanyị.
Ya bụ eze ọdịnala, onye kwuru na obodo ahụ anọbụọla afọ iri abụọ na abụọ n'enweghị Igwe, gàkwàrà n'ihu kelee Chineke maka udo ya na nchekwa ya, nakwa otu O si edu ụmụafọ obodo ahụ, ha wee na-apụ, na-abata, ma na-agawanye n'ihu, na-emekwa nke ọma na ngalaba dị icheiche.
N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere nà mmemme ahụ, nke gụnyere eze ọdịnala obodo Aguleri, bụ Igwe Michael Idigo; na onyeisi ọchịchị Ụmụeri General Assembly, bụ Johnny Metchie kèlèrè eze ọdịnala obodo ahụ maka ezi ọchịchị ya, kelekwa ya maka ihe dị icheiche pụtara ìhè ọ ya na ndị obodo ya na-eme iji kwalite omenala Igbo na ọdịmma ụmụaka ụmụnwaanyị. Ha kpekwazị̀rị̀ ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi na inye ya amamihe iji na-edu obodo ahụ etu kwesiri ekwesi.
Ya bụ mmemme, nke a kpọrọ “Ọvala Iveọma 2023” bụkwa nke a nọrọ na ya wee chie ụfọdụ ndị mmadụ echichi ọdịnala dị icheiche.
A nọkwàrà na ya bụ mmemme rie, ṅụọ, gbaa egwu Owuwa nke isii na egwu ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche, ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche mere ka anya na ọnụ bịara ebe ahụ ǹụ̀rịa.
What's Your Reaction?






