NSCDC Ejidela Mmadụ Asaa Maka Izu Ohi Eriri Ọkụ Latiriki n'Anambra

NSCDC Ejidela Mmadụ Asaa Maka Izu Ohi Eriri Ọkụ Latiriki n'Anambra
Ndị ohi ahụ na ihe dị icheiche e nwetere n'aka ha

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ụlọọrụ ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC)’ n'ime steeti Anambra, anwụchiela ụmụokorobịa asaa aka ọrụ ha bụ izukọsị eriri ọkụ latiriki na ihe ndị ọzọ bara uru dị n'obi ọkụ, bụ akụrụngwa ndị ‘Enugu Electricity Distribution Commission (EEDC)’ n'Anambra.

Onyeisi ụlọọrụ NSCDC na steeti Anambra, bụ Maazị Chukwudi Chikere bụ ya kwupụtara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n'Awka na nsonso a. 

O mere ka a mara na ndị ahụ abụghị naanị na ha na-akpagharị n'obodo n'obodo na-ezukọsị ihe ọkụ latiriik, kama na ha na-eyikwa ndị obodo egwu ma na-ezukwa ha ohi n'ụzọ dị icheiche, wee ruo mgbe ụlọọrụ ya nwetere ozi banyere ha na arụrụala ha, ọkachasị nke ha mere n'Obeledu na gburugburu ya.

Ọ sị na ọ bụ nke ahụ mezịrị ụlọọrụ ahụ jiri màbá imi n'ala ịchọpụta banyere ha na ebe nzuzo ha; ha wee mechaa, nwụchie mmadụ asaa n'ime ha n'Obeledu ahụ.

O nyere aha mmadụ asaa ahụ dịka Promise Chikamso (gbara ahọ iri atọ na abụọ ma bụrụ onye sitere Oji River nke steeti Enugu); Chinedu Onyimonyi (gbara ahọ iri atọ na anọ ma bụrụ onye sitere Onueke dị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ezza nke steeti Ebonyi); Sunday Nwube (gbara ahọ iri atọ na abụọ ma bụrụ onye sitere Onueke dị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ezza nke steeti Ebonyi); Ejike Stephen Ogonna (gbara ahọ iri abụọ, ma bụrụkwa onye sitere Onueke dị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ezza nke steeti Ebonyi); na Solomon Nwafor (gbara ahọ iri abụọ na asatọ, ma bụrụ onye sitere Onueke dị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ezza nke steeti Ebonyi).

Ndị ọzọ gụnyèrè Johnson Chigozie (gbara ahọ iri abụọ na atọ ma bụrụ onye sitere Ndiukwu Amaika dị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Ezza South nke steeti Ebonyi); na Solomon Nwankwo (gbara ahọ iri abụọ na abụọ, ma bụrụkwa onye obodo Okofia dị n'Ezza South nke steeti Ebonyi).

Ọ kpọpụtasịkwara ọtụtụ ihe dị icheiche ha nwetere n'aka ndị ahụ, nke gụnyere ihe ndị ha zutere ezute nà ngwaọrụ ha ji arụ ọrụ ọjọọ ahụ.

Maazị Chikere gakwàzịrị n'ihu kwuo na a ka na-eme nnyocha banyere ndị ahụ na ihe ha mere, ma kọwakwa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe n'oge adịghị anya banyere ihe ahụ ha mere, bụ ebe a ga-ejizị usoro iwu wee lee ha ọrụ.