N'Onitsha, Ụlọọrụ Nsọnyụọkụ na FRSC Egbochiela Ọkụ Ọgbụgba Gaara Ịdapụta

N'Onitsha, Ụlọọrụ Nsọnyụọkụ na FRSC Egbochiela Ọkụ Ọgbụgba Gaara Ịdapụta

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ nsọnyụọkụ, bụ Anambra State Fire Service, na ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ, bụ Federal Road Safety Corps (FRSC), ngalaba steeti Anambra, egbochiela ajọ ọdachi ọkụ ọgbụgba kaara ịdapụta n'Onitsha.

Ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nke kaara ịdapụta n'ihi mmebi otu ụgbọala e ji ebu ikuku mmụọ (gas) e ji esi nri, bụ nke otu n'ime ihe e ji agbanye ikuku mmụọ dị na ya tapuru atapu, ikuku mmụọ dị na ya wee na-ekufusi.

Mmebi ụgbọala ahụ mezịrị ka ka onye nwe ya kwụba ya bụ ụgbọala otu ebe, ikuku mmụọ ahụ wee na-ekufusi, nke mezịrị ka egwu jide ndị niile nọ na mpaghara ahụ, ma ndị na-azụ ahịa, ma ndị bi ebi ebe ahụ, ma ndị na-aga aga.

Ya bụ ihe bụ nke mere n'ebe a maara dịka “SISTER”, dị n'etiti njikọụzọ ‘Building Materials Junction’ and ‘Tarzan Junction’ n'Onitsha ahụ; ma bụrụkwa nke mere ka e nwee ike agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ebe ahụ ya bụ ihe mere.

Ka a garuru ebe ahụ, a hụrụ ka ndị ọrụ FRSC na-enye aka na-agbazi njem okporoụzọ, iji gbochie ụgbọala ọbụla ịga nso n'akụkụ ebe ahụ a kwụbara ụgbọala ahụ, maka ịkpalite ọkụ ọgbụgba.

A hụkwara ka ndị ọrụ nsọnyụọkụ Anambra nọ chịm ebe ahụ, ha na ụgbọala ọrụ nsọnyụọkụ ha, wee na-enyekwa aka na-agba mmiri ụfụfụ n'ụgbọala ahụ, iji gwakọrịta ikuku mmụọ ahụ maka ịgba ọkụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra, bụ Injinia Martin Agbili nyèrè nkọwa banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ nà mbọ dị icheiche ya na ndị ọrụ ya gbara iji hụ na ọkụ ọgbụgba maọbụ ụdị ajọ ọdachi ndị ọzọ adapụtaghị n'ebe ahụ.

Ọ kọwàrà na ọ bụ otu n'ime vaavụ̀ nke ihe ahụ e jiri gbanye ikuku mmụọ ahụ nwèrè nsogbu, ikuku mmụọ ahụ wee si ebe ahụ na-ekufusi; ma kọwakwa na ọ bụ n'ụtụtụ ka ha nwetàrà ozi banyere ọnọdụ mberede ahụ, nke mezịrị ka o jikere ndị ọrụ ya na ụfọdụ ụgbọala nsọnyụọkụ ha, wee gaba ebe ahụ ozigbo.

N'akụkụ nke ya, n'ozi ọ kụpụ̀rụ̀ n'aha onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ C.C. Adeoye Irelewuyi, onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ ahụ, bụ RC Margaret B. Onabe nyekwara nkọwa banyere mbọ dị icheiche ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya gbara iji hụ na e nwere ije awele okporoụzọ n'ebe ahụ ma gbochikwa ihe mberede okporoụzọ maọbụ ụdị ajọ ọdachi ndị ọzọ ịdapụta.

N'ozi ikpeazụ ha kụpụ̀rụ̀ banyere ọnọdụ ahụ, ha kọwàrà na e bupụ̀la ya bụ ụgbọala mebiri emebi ebe ahụ ọ dịbụ̀, ma kọwakwa Nnaochie a njem okporoụzọ amalitela ịga siriri-werere n'ebe ahụ, ebe ọdụ ahịa ndị mechisibụrụ emechi n'ebe ahụ mepèsigòkwara, n'enweghị nsogbu maọbụ ihe ọdachi ọbụla ọzọ siri n'ajọ ọnọdụ ahụ wee pụta.