Nne na Nna Anyị Jizị̀ Anyị Akwụ Ụgwọ Ha Ji — Ụmụaka Ụmụnwaanyị Yobe

Oct 19, 2022 - 16:01
 1
Nne na Nna Anyị Jizị̀ Anyị Akwụ Ụgwọ Ha Ji — Ụmụaka Ụmụnwaanyị Yobe


Izunna Okafor dere akụkọ a
 
Ọ na-abụ nwa nnụ̀nụ̀ mechie ọnụ ya,  agụụ egbughị ya, akpana afụ̀chie ya ike.

Ka ọ dị taa, ụfọdụ ụmụaka ụmụnwaanyị na steeti Yobe akwaala arịrị banyere otu e si amanye ha ka ha lụọ di maọbụ lụọ nwoke ọbụla e duteere ha, dịka otu n'ime ụzọ isi kwụbìlata ụgwọ nne na nna ha ji, n'ihi ihe isi ike.

Ụmụaka ụmụnwaanyị a kwupụtàrà nke a ụbọchị Tuzdee n'Abuja na mmemme a chịkọ̀bara iji merùbe emume ncheta ụbọchị Nwata Nwaanyị ná Mba Ụwa (International Day of the Girl Child) nke afọ 2022, bụ nke a chịkọ̀bara n'ebe ahụ site n'aka òtù ‘Save the Children International (SCI)’.

N'okwu ya na mmemme ahụ, otu nwatakịrị nwaanyị sitere steeti Yobe, bụ Khadija Badamasi kọwàrà na ọ bụ steeti ahụ (Yobe) kachara nwee ọnụọgụgụ ụmụaka ụmụnwaanyị lụrụ di n'erughị eru na mpaghara ọwụwa anyanwụ mgbago ugwu ala Nigeria.

Ka ọ na-akpọpụ̀ta ahụmahụ ya dịka nwata nwaanyị si na mpaghara ahụ, o mèrè ka a mara na ndị be ha na-agbaziri ego were kọọ ọrụ ugbo n'ihi ihe isi ike. Kaosiladị, ọ sị na ọ na-abụ oge owuwe ihe ubi ruo, ọ bụrụ na nwoke ahụ biiri ego wee kọ̀ọ́ ugbo enweghịzị ike ikwụghàchi ego ahụ o biiri, ò kèé nwa ya nwaanyị di, n'agbànyeghị afọ ole nwata nwaanyị ahụ dị. 

Ọ sịkwa na ọtụtụ n'ime ụmụnwoke a na-akpọnye ụmụaka ahụ ka ha lụba bụ̀cha agadi nwoke na ndị ruru ogo ịbụ nna-nna ha. O mekwazịrị ka a mara na ọtụtụ oge, a na-emegbu ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ emegbu n'ezinụlọ ebe ahụ a lụjere ha, maọbụ na-emeso ha ka óhù, ebe ha ga na-erizị arịrị na mkpụrụ obi maọbụ na-akwa akwa oge ụfọdụ, n'ihi ntaramahụhụ ha na-agabiga n'ezinụlọ ahụ nà n'alụmdinanwunye ahụ.

Badamasi gàkwàrà n'ihu kwuo na a na-esizị n'ụzọ dị otú ahụ na-emegide ikike dịịrị ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ, ma kpọọ òkù ka gọọmenti, òtù mba ụwa na òtù ndị ọzọ dị icheiche gbatara ha ọsọ enyemaka na mpaghara ahụ, n'ihi ajọ ọdachi ahụ.

Na mbụ n'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche otu na-ahụ maka ụmụaka isonye n'ihe a na-eme, bụ Nwaada Madina Abdulkadir kwùrù na ụmụaka ụmụnwaanyị nwèrè ikike na ùgwù dịịrị ha, dịka ụmụaka ụmụnwoke siri nwee, nke gụnyere agụmakwụkwọ, ahụike, na ihe ndị ọzọ.

Ọ dọ̀kwàzị̀rị̀ aka ná ntị na o kwesighị ka a kpụtọ̀ọ́ ikike dịịrị ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ maọbụ megide ha n'ụdị n'ụdị ọbụla.

Onye ọzọ kwukwara okwu ebe ahụ, bụ Maazị Amanuel Mamo tinyèkwàrà ọnụ wee kpọkuo gọọmenti n'ogoogo dị icheiche ka ọ mara ihe o mèrè banyere ọnọdụ ahụ, maka na ya bụ akụkọ bụ arụ jọgburu udele na njọ, sigbuo nkakwụ n'ísì.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484