N'Ekiti, Ndị Uweojii Ejidela Ụmụnne Abụọ Maka Ntọ̀

Jul 18, 2022 - 10:42
 0
N'Ekiti, Ndị Uweojii Ejidela Ụmụnne Abụọ Maka Ntọ̀


 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

Kọmishọna uweojii na steeti Ekiti, Moronkeji Adesina ekwuputala na ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ atọ bụ ndị ntọ̀ na steeti ahụ.

Dịka o siri kwuo, ndị ahụ a nwụchikọrọ bụ Abdullahi Musa gbara ahọ iri atọ na asatọ, Abdullahi Ali, ahọ iri abụọ na ise, na Abdullahi Suleiman dị ahọ iri na iteghete.
 Ali na Suleiman ka e kwuru na ọ bụ otu nne na nna mụrụ ha, ebe Musa nke kacha okenye na ndị ntọ ahụ si n'afọ nne na nna ọzọ.
 Kọmishọna uweojii ahụ kwuru na a nwụchikọrọ ndị ntọ̀ ahụ n'ime otu nnukwu ọhịa dị n'Ijan-Ekiti n'okpuruọchịchị Gbonyin na steeti ahụ. Ọ kọwara na ọ bụ site na njikọ aka nke ndị Rapid Response Squad (RRS) na ndị ọrụ nchekwa ogbe, ka e jiri nwụchikọ ha.

Adesina, n'ozi nke sitere n'aka okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, DSP Abutu Sunday n'Ado-Ekiti, kwuru na ndị ntọ ahụ ji ọnụ ha kwuputa, ka a na-ajụ ha ajụjụ na ha atọọl ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ.
Ọ sị: "Dịka otu n'ime mbọ ụlọọrụ uweojii steeti a na-agba iji kpochapụ ndị ntọ na ndị omekome ndị ọzọ na steeti a, Rapid Response Squad site na njikọaka ndị ọrụ nchekwa ime obodo, mara imi n'ala ma nwụchikọọ mmadụ atọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọ, n'ime oke ọhịa dị n'Ijan-Ekiti.”

O kwukwàrà na ndị ntọ ahụ gbara ama na ha dị mmadụ asaa n'òtù ha, ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nọ n'ọsọ ugbua, bụkwa ndị ndị uweojii na-agba mbọ ịnwụchikọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484