NDLEA Enyòpuola Ọgwụike E Zoro n'Isi Azụ

NDLEA Enyòpuola Ọgwụike E Zoro n'Isi Azụ

n'isi az

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ejidela otu nwoke zoro ọtụtụ ọgwụike n'isi azụ.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya mere ka ụwa mara nke a, ma kọwaa na ọ bụ ọgwụike mkpụrụ mmiri a maara dịka ‘Crystal Methamphetamine’ ruru narị anọ na iri anọ na abụọ n'ọnụọgụgụ ka nwoke ahụ zoro n'ime isi azụ, ma na-achọkwa ibupu ya gaa mba ofesi Dubai site n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa dị n'Ikeja, bụ isi obodo steeti Lagos.

Dịka o siri kwuo, a nwụchikọrọ onye e siri n'aka ya wee bute ọgwụike ahụ, bụ Maazị Adekunle Paul (gbárá ahọ iri atọ na abụọ ma bụrụkwa nwaafọ steeti Kogi) ngwangwa a chọpụtara na igbe asaa ọ butere maka ibupu ya mba ofesi nwechàrà ngwùgwù ọgwụike e kechiri ekechia bụrụkwa nke e zoro n'ime isi azụ.

Ọ sịkwa na na ha jidere ọgwụike cannabis sativa arọ ya ruru 1.4kg e zoro n'ime egwusi na ịsha (crafish) ma dokọta ya na ihe nri ndị ọzọ, na-achọkwa ibupu ya gaa Dubai site n'ọdụ ụgbọelu ahụ, ma jidekwa onye buru ya wee bịa, bụ Maazị Ajisefini Lateef.

O kwukwàrà na ha jidere otu nwoke, bụ Mgbeobuna Victor Eberechukwu (gbárá ahọ iri ise) oge o siri Addis Ababa nke mba Ethiopia wee wụ̀cháá, maka na o loro ọtụtụ ngwùgwù ọgwụike koken. Ya bụ nwoke bụ onye e kwuru na o si mpaghara Idemili North nke steeti Anambra, ma bụrụkwa o nye e jidere n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa Akanu Ibiam International Airport, wee ruo mgbe ọ nyụ̀gìdèrè wee nyụpụ̀tachaa ọgwụike niile ahụ n'ime abalị anọ.
 
Ebe ndị ọzọ ọ kpọpụtara ha jidere ndị mmadụ gụnyèrè steeti Kano, ebe ha jidere otu nwaanyị na-atụ mgbere ọgwụike, bụ Saratu Abdullahi (gbárá ahọ iri abụọ na asatọ) ma nwetekwa ọtụtụ ọgwụike cannabis n'aka ya; Kaduna, ebe ha jidere mmadụ atọ, bụ Saifullahi Sani, Salisu Nafi’u na Abdulrazaq Mamman ma nwetekwa ọgwụike tramadol karịrị otu nde n'ọnụọgụgụ n'aka ha; Abia, ebe ha jidere mmadụ abụọ, Nnanna Ijo (gbara ahọ iri ise na asatọ) na Orji Uguru (gbara ahọ iri abụọ na iteghete) ma nwetekwa ọtụtụ ọgwụike cannabis, heroin nq koken n'aka ha, ka ọ gachara naanị naanị otu izuụka e jiri tọhapụ otu onye n'ime ha bụ Maazị Nnanna n'ụlọ mkpọrọ maka ihe metụtara ọgwụike

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma gbàkwazie ha ume ka ha jisie ike n'ọrụ. Okwezịrị nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.