NDLEA Anwụchiela Chukwukadibia Maka Ọgwụike na Lagos

Oct 6, 2022 - 06:56
 0
NDLEA Anwụchiela Chukwukadibia Maka Ọgwụike na Lagos

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ejidela otu nnukwu ọgaranya a na-enyo ènyó na o jiri ịtụ mgbere ọgwụike mere aka ọrụ.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ a nsonso a.

Dịka o siri kọwaa, nwoke ahụ, bụ Maazị Ugochukwu Nsofor Chukwukadibia bụ onye e nwètèrè mkpụrụ ọgwụike Tramadol ruru 13,451,466 n'ọnụọgụgụ n'aka ya, bụ nke arọ ya ruru 225mg, ma bụrụkwa nke ọnụ ahịa ya ruru ijeri naịra asatọ na ụma narị asatọ na isii (N8,860,000,000) ma e ree ya eree.

O mere ka a mara na ọ bụ n'ụlọ nwoke ahụ dị n'ebe a maara nke ọma na mpaghara Victoria Garden City nke Lekki, dị na steeti Lagos ka e jidere ya bụ nwoke, bụ ebe a hụrụ o debesiri ọgwụike ahụ, nke o tinyesiri n'ìgbé, wee debesie ha ka ngwaahịa.

Ọ kọwàrà na nwoke ahụ gbara ahọ iri anọ na ise bụ̀ nwaafọ Ihiala dị na steeti Anambra, ka bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ ‘Autonation Motors Ltd’. O mèkwàrà ka a mara na o teelarị̀ NDLEA bidoro tinyebere nwoke ahụ anya ma na-achọkwa ya mbiaka-mbiaka dịka otu n'ime ndị otu n'ime a mà ama na-atụ ọgwụ Tramadol n'ala Nigeria.

Ọ gara n'ihu kwuo na njide ahụ e jidere Chukwukadibia bụ nke bịara ka ọ gachara ihe dịka ọnwa abụọ e jidechara otu nwoke ọzọ bụ Chris Emeka Nzewi n'otu ụlọ ahụ maka ọgwụike n'ọnwa Julaị afọ a, ma jidekwa onye na-ahaziri ya ọgwụike, bụ Sunday Ukah.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị ọrụ NDLEA jidekwara otu nwa amadi bụ onye òtù egwu bọọlụ ala Nigeria n'oge mbụ, bụ Emmanuel Junior Okafor maka ọgwụike ma nsonso a.

Maazị Okafor bụ onye a nwụchikọrọ na mpaghara ọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, dị na steeti Lagos oge o si Sao Paulo nke mba Brazil wụ̀chie.

Akụkọ kọrọ na ya bụ nwa amadi dị́ afọ iri atọ na atọ ma bụrụkwa onye obodo Arochukwu dị na Steeti Abịa, bù ọgwụike koken ruru 1.40kg n'ime àkpà ya wee wụ̀chie site n'ụgbọelu Ethiopian Airlines, aka wee kpàrá ya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma gbàkwazie ha ume ka ha jisie ike n'ọrụ. O kwezịrị nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484