Ndị Uweojii Ejidela Nwaanyị Zuru Ohi Nwa n'Anambra

Ndị Uweojii Ejidela Nwaanyị Zuru Ohi Nwa n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii anwụchiela otu nwaanyị, bụ Chinwendu Umegbaka maka izu ohi nwa na steeti Anambra.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu bụ ya kwupụtara nke a, ma mee ka a mara na ya bụ ihe mere n'Okpoko dị n'Onitsha.

O kwuru na nwaanyị ahụ bụ onye agbataobi nne na nna nwatakịrị ahụ o zuuru, ma kọwaa na ọ na-agabụ agụgọ oge a jụrụ ya maka ebe nwata ahụ nọ, wee ruo mgbe ndị uweojii gbara ya ajụjụọnụ, tupu o kwuo eziokwu na ọ bụ ya zuuru nwata ahụ. Ọ sịkwa na nwaanyị ahụ kwuru na ebumnobi o jiri zuru nwa ahụ bụ ka o wee ree ya ma jiri ego ya gbòó mkpa dịịrị ya.

Dịka DSP Tochukwu siri kọwaa, nwaanyị ahụ zuru nwa ahụ gbàrà ahọ iri abụọ na iteghete, ma bụrụ onye obodo Isinkwo Abaomege dị n'okpuruọchịchị ime obodo Onicha, nke steeti Ebonyi.

Ọ kọwara na a napụtala ya nwa ahụ ugbua, ma kpọnye ya ndị mụrụ ya, ebe ya onwe ya nọkwazị n'aka ndị uweojii ugbua.