Ndị Òtù Adịmọcha Agaala Kpọtụrụ Igwe Nnewi

Ndị Òtù Adịmọcha Agaala Kpọtụrụ Igwe Nnewi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị òtù a maara dịka ‘Sustainable Urban and Rural Water Supply, Sanitation and Hygiene (SURWASH)’ akpọkuola ụmụafọ steeti Anambra ka ha kwụsị ịga mposi ebe ekwesighị ekwesi, bụ nke a maara dịka ịrụ arụrụnsị.

Ndị òtù a kpọrọ òkù a na nsonso oge ha gara kpọtụrụ eze ọdịnala obodo Nnewi, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Nnewi North, bụ Igwe Kenneth Orizu, dịka otu n'ime atụmatụ dị icheiche ha na-abagide na ya ugbua iji gbasaa ozi banyere adịmọcha na ime ka ndị ọchịchị na ndị obodo ahụ ghọta mkpa ọ dị inye aka kwụsị arụrụnsị.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onye ji ọkwa dịka ‘National Co-ordinator’ nke atụmatụ ‘Clean Nigeria and Use the Toilet Campaign’, bụ Oriakụ Chizoma Opara gwara eze ọdịnala obodo ahụ na ndị isi ọchịchị na ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na Nnewi ahụ nwèrè nnukwu ọrụ chere ha n'ihu iji wepụ aha Nnewi n'aha obodo ndị e jiri arụrụnsị wee mara ma mee ka ọ banye n'aha obodo ndị e ji adịmọcha wee mara.

Ọ kọwàrà na imezupụ̀ta nke ahụ ga-enyekwa aka n'ịkwàlite ezi ọnọdụ gburugburu dị ọcha na steeti ahụ, bụkwa nke ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ na-agbasi mbọ ike iweta na mmezu.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onye ji ọkwa Anambra State Hygiene Officer, bụ Dọkịta Rose Amasiani, na onyeisi ụlọọrụ ‘Creative Mind Center for Youths and Community Development’, bụ Oriakụ Ugochi Freeman mere ka ndị obodo ghọta ọghọm dị icheiche jupụtàrà na mmadụ ịga mposi ebe ekwesighị ekwesi, ma kpọpụtasikwa ụzọ dị icheiche ha si agba mbọ, na atụmatụ dị icheiche ha na-abagide na ha, iji weta ya bụ ọnọdụ na njedebe, ọkachasị site n'enyemaka ndị obodo, bụkwa nke mere ha jiri bịa njem mkpọtụrụ ahụ.

Onye ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ, bụ onye ji ọkwa ‘Programme Manager’ bụ Maazị Tochukwu Nwosu kwuru na ha na ndị òtù Nzukọ Ọra Nnewi na eze ọdịnala Nnewi na ndị ichie ya ga-arụkọ ọrụ ọnụ iji gbasaa ya bụ ozi ha jiri bịa, bụkwa nke ebumnobi ya bụ ịhụ na ha wetara arụrụnsị na njedebe tupu ahọ 2025, dịka ọ dị na nkéji 6.1 na 6.2 nke ámụmà ‘Sustainable Development Goals (SDGs)’.
 
Na nzaghachi ya, eze ọdịnala Nnewi, Igwe Orizu, nke onye nochitèrè anya ya bụ nwa ya nwoke, bụ Chukwudi Orizu kèlèrè ndị ahụ maka njem mkpọtụrụ ahụ, ma kọwaa ebumnobi ahụ ha jiri bịa dịka nke magburu onwe ya.

Banyere ya bụ okwu a kpụ n'ọnụ, o mere ka a mara na ezinụlọ dị icheiche n'obodo ahụ nwegbadoro ụlọ mposi, ma kọwaa na ọ bụ okpochintị so n'ihe na-eme ọtụtụ n'ime ha ji ahapụ ụlọ mposi ha na na-aga mposi ebe ekwesighị ekwesi; ọbụladị dịka o kwuzịrị na ha ga-eweputa ntaramahụhụ siri ike ugbua maka onye ọbụla gara mposi ebe ekwesighị ekwesi, dịka otu n'ime ụzọ isi weta arụrụnsị na njedebe n'obodo ahụ.