Ndị Ọrụ Nchekwa Azọpụ̀tala Mmadụ Abụọ Ndị Omekome Tọ̀ọ̀rọ̀ n'Anambra

Ndị Ọrụ Nchekwa Azọpụ̀tala Mmadụ Abụọ Ndị Omekome Tọ̀ọ̀rọ̀ n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịga n'ihu na n'agha ahụ a na-ebu megide mpụ na ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti Anambra, ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ azọpụtala mmadụ abụọ ndị omekome tọọrọ, ka ọ gachara áwà olenole e jiri tọrọchaa ha.

Ndị ahụ bụ ndị e kwuru na ndị omekome bu ụgbọala Honda Pilot jìrì égbè wee tọrọ na mgbede ụbọchị Tuzdee.

Akụkọ kọrọ na ndị ntọ ahụ wụ̀chaa n’okporoụzọ Abatete—Alor—Ogidi n’uhuruchi Tuzdee wee malite ọrụ ozigbo, ma nọrọ ebe ahụ tọrọ mmadụ abụọ bụ Injinia Emeka Joseph Ezeigwe (nwoke, dị ahọ iri isii na anọ), na Dọkịta Peter Ifeanyichukwu Okafor (nwoke, dị ahọ iri anọ na ise), wee buru ha gbapụ ozigbo gaba ebe mmadụ amaghị. E kwukwàrà na ndị ọ bụ n'ụgbọala otu onye n'ime ndị ahụ a tọọrọ ka e jiri buru ha wee pụọ, tinyere ụgbọala nke ha jiri wee bịa.

Ya mere, mgbe ndị ọrụ nchekwa nwetara ozi banyere nke ahụ, ha jikeere onwe ha ngwangwa, wee pụọ, malite ọrụ ịchọgharị ndị ahụ, bụ nke mere ha jiri mugide anya n'ime abalị niile, wee mechaa, napụta ha n’ime ọhịa dị n’Ojoto, n’okpuruọchịchị ‘Idemili South’ nke steeti ahụ, n’ihe dị ka elekere ise nke ọnụ ụtụtụ ubochi Wenezdee.

N’okwu ha gwara ndị ntaakụkọ n’Awka oge ha na-akọ etu ha na ije siri gaa, ndị ahụ a napụtara kọwàrà na ndị ahụ tọọrọ gbahapụrụ ha n’ime ụgbọala ahụ n’ime nnukwu ọhịa ebe ha nọ, mgbe ha chọpụtara na ọ dị ka ndị ọrụ nchekwa ọ na-esochi ha azụ, nke mezịrị ka ha gbahapụ ha ebe ahụ ma chọbagodi ụzọ ha ga-esi zọta isi onwe ha maọbụ buso ndị ọrụ nchekwa ahụ agha.

N'okwu ya, otu n’ime ndị ihe ahụ a napụtara, nụ Injinia Ezeigwe (bụ́ onye ọrụ gọọmentị lagoro ezumike nka) ma bụrụkwa onye obodo n’Abatete dị n’Idemili North nke steeti ahụ, kwuru na ọ gara iburu nwunye ya n’ebe ọ na-ere ahịa ka ha laa, n’ihe dịka elekere isii nke uhuruchi ụbọchị Tuzdee ahụ; ma kọwaa na ọ bụzị ebe ahụ ọ nọ na-eche nwunye ya ka ụgbọala kwụsịrị ozigbo, ndị nọgasị n'ime ya rituo, wee jiri égbè nara ya ụgbọala Lexus 330 RX ya, ma tụnye ya n'ime ụgbọala ahụ ahụ buru ya gatụ obere, kwụsị.

Ọ sị na oge eteghị aka, na ha ndị omekome ahụ jidekwara onye ọzọ n'okporoụzọ ahụ, ma kwabatakwa ya n'ebe ahụ ya onwe ya nọ, kechie ha anya, ma buru ha pụọ, wee gaba ebe ha amaghị.

N'akụkụ nke ya, onye nke abụọ ahụ ha tọọrọ, bụ Dọkịta Okafor, kọwàra ka ha siri gaa n'ime ọhịa ahụ na ahụhụ dị icheiche a tara ha, wee ruo mgbe ndị ọrụ nchekwa megidere ihe wee zọpụta ha n'ụtụtụ ụbọchị Wenezdee.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ahụ tọọrọ enweghị ike ibu ụgbọala nke ya, bụ Lexus Jeep GS 470 wee pụọ oge ahụ a tọọrọ ha n'ihi na ha jiri égbè wee gbọwaa ụkwụ ụgbọala, bụ nke mezịrị ha jiri tinye ya n'ụgbọala onye nke ọzọ, tupu buru ha pụọ.

Ka ha na-ekele Chineke maka ịzọpụta ndụ ha, ha kelèkwàra ndị ọrụ nchekwa steeti Anambra maka ịgbambọ ha, bụ nke ha kwuru na o meela ka obi sie ha ike karịa ma bawanyekwa ntụkwasịobi ọhaneze n'ebe ndị ọrụ nchekwa nọ, ya na ezi njikere ha nwere ịnapụta ndị mmadụ na ibu agha megide ajọ ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria 

Ha dụkwara ọhaneze ọdụ ka ha na-eke nkwụ̀chà oge niile ma na-enyere ndị ọrụ nchekwa aka n'arụmọrụ ha site n'inye ha ozi dị icheiche ga-enyere ha aka n'ibu agha megide mpụ na arụrụala, maka na ọrụ nchekwa bụ ihe dịịrị onye ọbụla.