Ndị Ọrụ Nchekwa Agbagbuola Ndị Omekome Abụọ n'Anambra

Ndị Ọrụ Nchekwa Agbagbuola Ndị Omekome Abụọ n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ọrụ nchekwa n'ime steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee gbagbuo mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekome n'Okịja,  dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Ikenga Tochukwu bụ ya kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kwuo, agha ahụ bụ nke e buru site na njikọaka ụfọdụ ụlọọrụ nchekwa dị icheiche dị na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke e buru na mpaghara njikọụzọ nke okporoụzọ awara-awara ahụ siri Onitsha gaa Owerri, bụ ebe ahụ e si abanye n'ahịa Nkwọ Ọkịja, ebe ndị omekome ahụ jiri ụgbọala dochisie ụzọ, ma na-ezu ndị mmadụ na-agara onwe ha ohi.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ oge ndị ọrụ nchekwa nwetere ozi banyere nke ahụ ka ha jikọtara onwe ha ọnụ, wee wakpo ndị omekome ahụ, buso ha agha, ma gbagbuo otu onye n'ime ha, ebe ndị ọzọ bukwàrà àpà mgbọ wee rie mbọmbọ ọsọ.

DSP Tochukwu kwukwara nà n'otu ụbọchị ahụ, ndị ọrụ nchekwa ahụ zùtèkwàrà ndị omekome ọzọ ebe ha na-emekpà ndị mmadụ ahụ n'ahịa Nkwọ Ọkịja ahụ, ha wee busokwa ha agha ma gbagbukwa otu onye n'ime ha, ebe ndị ụzọ gbakwara ọsọ.

O kwuru na e nwetesiri ụfọdụ ihe dị icheiche n'ebe ahụ a gbagburu ndị ahụ, nke gụnyere egbe ‘Pump Action’ atọ, otu mma oge, otu ụgbọala Lexus jeep 350 (nwere akara KJA- 666HE), otu ugbọala ‘Toyota Hilux jeep’ enweghị akara, otu ụgbọala ‘Toyota Corolla’ (nwere akara HAL- 732RF), otu ụgbọala ‘Highlander Jeep’ enweghị akara, na ọgbatumtum anọ enweghị akara, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

Dịka ọ na-eme ka a mara na o nweghị onye ọrụ nchekwa nwụrụ maọbụ nweta mmerụahụ n'ọrụ ahụ; ọ gara n'ihu kwuo na ha ka na-agbasi mbọ ike iji nwụchikọọ ndị otu ahụ ndị nke nọ n'ọsọ ugbua.

N'okwu ya banyere nke ahụ, Kọmishọna ndị uweojii na steeti Anambra, bụ Maazị Echeng Echeng kelere ndị ọrụ ya maka ezi arụmọrụ ahụ na mmeri ahụ ha na-enweta.

O jikwazịrị ohere ahụ wee mee ka ndị Anambra mara na ụlọọrụ ya na-agbasi mbọ ike iji hụ na e weghachitere ezi nchekwa ndụ na akụnụba zuru òkè na steeti ahụ; ma kpọkuo ha ka ha gaa n'ihu na-akwàdo ndị ọrụ nchekwa na gọọmentị n'ọgụ ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala na steeti ahụ site n'inye mkpesa ozigbo banyere onye maọbụ akparamagwa ọbụla a na-enyo enyo ha hụtara na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ, bụ nke ha pụrụ ime site n'ịkpọtụrụ ákàrà ekwentị ahụ e wepụtesiri maka nke ahụ.

O tòrò ndị Anambra maka nkwàdó ha nyegooro ndị ọrụ nchekwa ruo ugbua n'ịlụ ọgụ megide mpụ na arụrụala na steeti ahụ, ma kwe nkwà na ụlọọrụ ya agaghị ada mbà n'ọgụ ahụ ọ na-alụ imemilà mpụ na ajọ ọnọdụ nchekwa n'Anambra.