Ndị Ntaakụkọ Anambra Eriela Ji Ọhụụ, Kpọọ Òkù Nkwalite Asụsụ na Omenala Igbo

Oct 28, 2022 - 10:26
 0
Ndị Ntaakụkọ Anambra Eriela Ji Ọhụụ, Kpọọ Òkù Nkwalite Asụsụ na Omenala Igbo

Izunna Okafor na Ifeanyi Ndukwe dere akụkọ a


Ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụ̀tàrà ihe na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ndị òtù ahụ jikọtara ndị ntaakụkọ bụ ‘Nigeria Union of Journalists, NUJ’ (ngalaba steeti Anambra) merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ nke afọ 2022.

Ya bụ mmemme bụ nke ndị NUJ mere site na njikọaka ndị ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka omenala na njem nlegharịanya, na ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka ọchịchị ime obodo ma echichi ọdịnala, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ ndị ntaakụkọ ahụ dị n'Awka.

Na nkụzi ya n'ebe ahụ nke isiokwu ya bụ “Ndị Ntaakụkọ na Asụsụ Igbo: Ịgbanahụ Ọnwụnwụ Asụsụ Igbo”; onye ọbịa pụrụ iche nyere nkụzi na mmemme ahụ, bụ Dọkịta Ekene Okafor kpọpụtasịrị ihe dị icheiche na-echere asụsụ Igbo aka mgba taa, ya na otu ndị mmadụ si akwadà asụsụ ahụ, ma n'ezinụlọ dị iche, ma n'ụlọụka, ma n'ụlọọrụ, ma n'ebe ndị ọzọ.

O mekwara ka a mara na ọtụtụ ụlọ mgbasaozi dị icheiche n'ala Igbo anaghị enyekarị nnukwu oge kwesiri ekwesi maka ihe mmemme n'asụsụ Igbo, ebe ọtụtụ nne na nna anaghịzịkwa asụrụ maọbụ kụziere ụmụ ha asụsụ Igbo. Ọ sịkwazị na ọtụtụ ụlọụka dị icheiche n'ala Igbo bụzị asụsụ Bekee ka ha ji aka ụka, ma kọwaa na ihe ndị ahụ sò n'ihe mere asụsụ Igbo jiri nọrọ n'ọnọdụ ọ nọ na ya taa.

O chètààrà ndị ntaakụkọ na ụlọ mgbasaozi dị icheiche na ha nwere nnukwu ọrụ dịịrị ha n'ịkwàlite na n'ichekwaba asụsụ Igbo ka ọ ghara ịnwụ maọbụ fuo dịka ndị òtù mba ụwa United Nations Education, Scientific and Cultural Organisation (UNESCO) siri buo n'amụma, nà asụsụ Igbo ga-anwụ oge adịghị anya.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Maazị Tonycollins Nwabunwanne kèlèrè ọhaneze sonyere na mmemme ahụ, kelee ndị ntaakụkọ Anambra maka ịchịkọ̀bà ya bụ ọmarịcha mmemme, ọbụna dịka ọ rịọrọ ha ka ha nyekwa aka na-agbasara ụwa ozi banyere ọrụ ọma dị icheiche ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na-arụ na steeti ahụ.

N'akụkụ nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka Omenala na njem nlegharịanya, bụ Maazị Don Onyenji kọwàrà ya bụ mmemme iri ji ọhụụ dịka nke magburu onwe ya, tòó ndị òtù NUJ Anambra na ndị isi ha maka ịchịkọ̀bà ya bụ mmemme, kpọọ òkù ka e jigidesie ya bụ mmemme ike, n'ihi na nke ahụ sòkwà n'otu ụzọ pụrụ iche a ga-esi kwàlité ma mee ka omenala Igbo guzosie ike ma kwụrụ chịm, bụkwazị nke bụ isi sekpụ ntị n'ọrụ dịịrị ụlọọrụ ya.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, mgbe ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, eze ọdịnala Okpuno, bụ Igwe S.C. Ogene kpèrè maka ogologo ndụ, oganihu, ezi ahụike na ezi nchekwa; ebe Osote Onyeisi Mahadum Paul (Paul University, Awka), bụ Ọkammụta Stella Okunna gwara ndị ntaakụkọ Anambra ka ha jide ka ha ji.

Na mbụ n'ozi nọọ ya, onyeisi òtù NUJ na steeti Anambra, bụ Dọkịta Emeka Odogwu kọwàrà mmemme iri ji ọhụụ dịka otu n'ime omenala e jiri mara ndị Igbo, ma kọwakwa nke ahụ dịka otu ụzọ ndị ntaakụkọ ahụ si atụnye ụtụ n'ịkwàlite omenala Igbo. O kèlèrè ndị òtù ọrụ pụrụ iche hụrụ maka ịhazi mmemme ahụ maka ịgba mbọ ha hụ na a haziri ya bụ mmemme n'ụzọ pụrụ iche. 

Dịka ọ na-ekele ọhaneze sonyere na mmemme ahụ, ọ kpọkukwàzị̀rị̀ ụlọọrụ dị icheiche na gọọmenti ka ha na ndị ntaakụkọ na-ejikọ aka ọnụ oge niile, maka na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ̀.

A nòrò na mmemme ahụ ahụ gbaa egwu ọdịnala dị icheiche, tie mmanwụ Ijele na Ịzaga, ma mekwa ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche. A nọkwàrà na ya bụ mmemme rie ụdị erimeri dị icheiche, ọkachasị ji a hụrụ ahụ, bụ nke e jiri mmanụ akwụ ọhụrụ, ụkpaka na akwụkwọ ụtazị mara abụba wee hazie, tinyéré mmanya jụrụ oyi e jiri gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484