Ndị ntaakụkọ Anambra ejirila ọṅụ mechie afọ

Dec 25, 2022 - 04:47
 0
Ndị ntaakụkọ Anambra ejirila ọṅụ mechie afọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ nnukwu mmemme jupụtàrà n'obi aṅụrị, dịka òtù jikọtara ndị ntaakụkọ n'ime steeti Anambra, bụ nke a maara na bekee dịka ‘Nigeria Union of Journalists (NUJ)’ gbakọ̀tara wee pịachie akwụkwọ maka afọ 2022.

Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ ndị ntaakụkọ ahụ dị n'Awka ụbọchị Wenezdee, ma bụrụkwa nke imirikiti ndị òtù ahụ, ụmụakwụkwọ, na ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche sonyere nà ya.

N'ozi nnọọ ya n'ebe ahụ, onyeisi NUJ n'ime steeti Anambra bụ Dọkịta Odogwu Emeka Odogwu fọ̀rọ̀ ekele n'ụkpa wee bunye ndị òtù ahụ maka ọmarịcha nkwàdó dị icheiche ha nyèrè ọchịchị ya n'ime afọ a, n'ihi na ọ bụ n'ime afọ a ka ọ banyere n'ọkwa dịka onyeisi òtù ahụ.

Ọ kpọpụtasịrị̀ ụfọdụ ihe dị icheiche ya na ndị òtù ya mepụtagoro, ma kelekwazie ndị mmadụ na ndị òtù dị icheiche nyere ha na ndị NUJ Anambra nkwàdó n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ọbụna dịka o kwupụtàrà olileanya o nwere na afọ na-abịa abịa ga-amakarị nke a.

Ọ dụ̀kwàzị̀rị̀ ụmụakwụkwọ sonyere nà mmemme ahụ ọdụ ka ha dị uchu n'agụmakwụkwọ ha, ma gwakwa ha ka ha gbasie mbọ ike ịbụ ndị ntaakụkọ a na-anụ aha ha anụ na e ji ama atụ n'obodo n'ọdịnihu.

Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisioche mmemme ahụ, bụ Ọkammụta Emeka Ezeonu kọwàrà ndị nta akụkọ dịka ahụghị ebule ma sị elina dike n'ebe ihe gbasara ịkwàlite mmepe obodo dị, maka na a naghị ahapụ isi aka wee gbaba ụrịọm. 

Dịka ọ na-akpọpụ̀tasị ụfọdụ ụzọ na usoro dị icheiche ndị ntaakụkọ si agbazi ka ihe si aga ma na-akwàlite ọganihu n'obodo; ya bụ Ọkammụta kèlèrè ndị ntaakụkọ Anambra maka ịdị uchu ha na ịgba mbọ ha, bụkwa nke na-apụ̀ta ìhè n'etu ha si ahazi na etu ha si agbasa ozi ha. 

O jikwara ohere ahụ dụọ onye ọbụla ruru ogo ịtụ akwụkwọ ọdụ ka ọ gbaa mbọ hụ na o nwètèrè akwụkwọ ikike ahụ e ji atụ akwụkwọ, ma sonyesikwa ike n'ime ya bụ nhọpụta izugbe a ga-eme n'afọ na-abịa abịa, iji hụ na ọ bụ ndị kwesiri ekwesi ka e tinyere n'ọkwa ọchịchị. 

Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere nà mmemme ahụ gụnyèrè Osote Onyeisi Mahadum Paul (Paul University) dị n'Awka, bụ Ọkammụta Stella Okunna; Kọmishọna na-ahụ maka Agụmakwụkwọ n'Anambra, bụ Ọkammụta Ngozi Chuma-Udeh; Onyeisi ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, Maazị Chuka Nnabuife; tinyéré ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọkwàrà na mmemme ahụ guzobe ụfọdụ ndị mmadụ dịka ndị nnukwu nna nke òtù NUJ Anambra, ma kpọpụtakwa mpụtara asọmpi Edemede Ntaakụkọ nke Ọkammụta Stella Okunna (Prof. Okunna Award for Ethical Journalism) nke afọ a, bụkwa nke onye ntaakụkọ Radio Nigeria, Maazị Alfred Ajayi tuuru ugo na ya dịka ọkaibe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484