Ndị Ifitedunu Ekeleela Soludo Maka Iwèta Udo n'Obodo Ahụ

Ndị Ifitedunu Ekeleela Soludo Maka Iwèta Udo n'Obodo Ahụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị obodo Ifitedunu, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Dunukọfịa nke steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, maka iweghàchite ọnọdụ udo n'obodo ahụ ka ọ gachara ahọ olenaole ha jiri nwebe nsogbu banyere ọchịchị obodo ahụ.

Eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Emeka Ilouno bụ ya kwupụtara nke a oge o duru ụmụafọ obodo ahụ wee wụchaa n'obi gọọmenti dị n'Awka, bịa ịsị Gọvanọ Soludo Daalụ maka ịzọbata ụkwụ na nsogbu ọchịchị obodo ahụ dịbara kemgbe, wee weta udo tọrọ àtọ n'obodo ahụ, site n'iweghàchi na iguzobegharị onyeisi ọchịchị (President-General) ndị obodo ahụ jiri aka ha họpụta.

Ndị ahụ bugasị akwụkwọ e degasịrị ihe dị icheiche na ha, dịka ‘Daalụ Soludo’, ‘Soludo, I Mere Nke Ọma’, ‘Soludo, Onyeisi Udo’, na ụfọdụ ederede ndị ọzọ wee bịa n'ebe ahụ

N'okwu ya n'ebe ahụ, Igwe Ilouno kwuru na ọbịbịa ha ebe ahụ bụ otu n'ime ụzọ ha siri chọọ igosipụta obiụtọ ha banyere ihe ahụ Gọvanọ Soludo meere obodo ahụ, ma sịkwa ya jisie ike n'ọrụ.

O mere ka a mara na nsogbu banyere ọchịchị obodo ahụ malitere n'ahọ 2015, ma nyekwa nkọwa banyere etu onye chịrị obodo ahụ n'oge mbụ, bụ Maazị Samuel Nwaeke si enye obodo ahụ na ụmụafọ ya nsogbu malite na mgbe ọ nọ n'ọkwa ọchịchị na mgbe ọ rịtuchara, ndị obodo wee họpụta Maazị Uchenna Oragwuncha Nwoye dịka onyeisi ọchịchị ha, bụkwa onye e mechaara si n'ụzọ aghụghọ wepu ya n'ọkwa.

O kwuru na n'ikpeazụ a, ọchịchị Soludo batara n'ọkwa, wee zọbata ụkwụ n'okwu ahụ, bụ nke mụtagoro ọtụtụ nsogbu na ọgbaaghara n'obodo ahụ, wee kpọghachi ma guzobe onyeisi ọchịchị nke ahụ a kwaturu akwatu n'oge mbụ, bụ Maazị Oragwuncha Nwoye

O kwukwazịrị na ndị obodo ahụ, ma ndị nọ n'ụlọ ma mbi bi na mba ofesi nwere obibañụrị maka mkpọghachi ahụ a kpọghachiri Maazị Nwoye, bụkwazị nke mere ha jiri sị ka ha bịa gosipụta obi añụrị ha, ma zitekwara ya ozi ekele maka ihe ahụ o mere.

Ọ rịọkwazịrị Gọvanọ ka o nye aka hụ na a kpọpụtara ụfọdụ ndị ntorobịa obodo ahụ aka ha dị ọcha Maazị Nwaeke kpọchisiri n'ogige ndị uweojii maka na ha akwụnyereghị ya oge ahụ nsogbu ahụ na-aga n'ihu n'obodo ahụ.

Na nzaghachi ya n'aha Gọvanọ Soludo, Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na steeti ahụ, bụ Maazị Tony-Collins Nwabunwanne, nke na-ahụ maka mgbasaozi ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Henry Nwasike nọchiri anya ya, kwupụtara ezi njikere ọchịchị Gọvanọ Soludo dị ịhụ na e nwere ezi udo tọrọ àtọ n'obodo niile dị na steeti ahụ, bụ nke mere o jiri weta nsogbu ahụ dị n'obodo ahụ na njedobe. Ọ sịkwa na Gọvanọ Soludo emeela ụdị ihe dị etu ahu na mpaghara ọtụtụ obodo ndị ọzọ dị icheiche na steeti ahụ, ebe e nwebụrụ otu nsogbu maọbụ nke ọzọ, wee wètá udo.

O kwere nkwa na Gọvanọ ga-elebakwa anya n'okwu banyere ndị ntorobịa ahụ a kpọchiri akpọchi; ma kpọkuo ndị obodo ahụ ka ha jigidesie udo ahụ batagoro n'obodo ahụ ka ọ ghara ịghasà ọzọ. Ọ dụkwara ha ọdụ ka ha na-ewetara gọọmenti mkpesa banyere nsogbu maọbụ ihe maọbụ onye ọbụla chọrọ iweta nsogbu ọzọ n'obodo ahụ, ka o lebara ya anya ozigbo, karịa iji aka ha wee na-agbaso nsogbu ahụ n'usoro nke ha, bụkwa usoro nwere ike ime ka nsogbu ahụ kawanye njọ.