Ndị Enugwu-Agụleri Emeela Olili Ọbịbịa Eri Afọ 2022

Nov 16, 2022 - 11:10
 0
Ndị Enugwu-Agụleri Emeela Olili Ọbịbịa Eri Afọ 2022

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Enugwu-Agụleri dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Anambra East' nke steeti Anambra merùbèrè mmemme Oriri Ọbịbịa Eri, bụ otu nnukwu mmemme ọdịnala pụrụ ichè e jiri mara obodo ahụ.

Ya bụ mmemme bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà afọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ha sitèrè na ya na-akwanyere nnukwu nna mụsàrà ha ùgwù, bụ́ Eri, ónyé bụ nwa mbụ nke Gad, otu n'ime ụmụ Jekọb (Jacob) dịka ọ dị n'Akwụkwọ Nsọ, bụ́kwa onye e kwenyere na ọ bụ ya mụsàkwàrà Ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụrụkwa nnukwu nna-nna ha.

Nnukwu mmemme ahụ wèèrè ọnọdụ n'obí eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Eze Chukwuemeka Eri, bụkwa onye nọ n'isi mmemme ahụ. Ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na dị icheiche e ji okwu ha agba ìzù na steeti Anambra na mpụga ya sonyèkwàrà na mmemme ahụ.

A màlitère ya bụ mmemme site n'ịbagide ịga njem nleta nke eze ọdịnala obodo ahụ gara n'ebe a na-akpọ Agbanabọ Ezu na mmiri Ọmambala, bụ ebe nnukwu nna-nna ha ahụ bụ Eri kwụsịrị tupuu o wee bàta ka o biri n'ala ahụ a maara taa dịka Agụleri. Ọ nọkwazịrị n'ebe ahụ kpee ekpere, jụ̀cháalá àlà, ma chụfuo ihe ọjọọ n'obodo ahụ, na n'isi ụmụafọ Eri niile.

Oge ọ na-agọ ọjị na mmemme ahụ, ya bụ eze ọdịnala kpekwazịrị ekpere ngọzị, ọganihu, nchekwa, ahụike, ogologo ndụ na ihe akụakụ na ihe enweenwe n'isi ụmụafọ obodo ahụ niile nọgasị ebe dị iche iche.

Ya bụ mmemme dọtàrà ndị eze ọdịnala dị icheiche emume ọdịnala ahụ metụtara, nke gụnyere eze ọdịnala obodo dị icheiche gbara obodo ahụ gburugburu.
Ndị eze ọdịnala ahụ, n'okwu ha n'otu n'otu, mèrè ka a mara na ha na-esonye ma na-abịakọta ọnụ na mmemme ahụ kwà afọ ọbụla, iji sọpụrụ ma kwanyere nnukwu nna ha bụ Eri ùgwù etu o siri kwesi, dịka onye mụsàrà Igbo niile. 

Ha kwukwara na ha na-ahụta mmemme ahụ dịka ihe nke mmụọ, ma kọwaa na njem ahụ a bagidere na mmiri ahụ bụ iji kpọlite mmụọ nna ha bụ Eri. Ha kpọkukwazịrị onye ọbụla bụ ezi nwaafọ Igbo ka ọ na-akwàdó njirimara na omenala ya ike, maka na ezi omenala kwesiri ịbụ nwata tote o tokwuru.

Ndị dị iche iche kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisioche mmemme ahụ nke afọ a, bụ Nze Joseph Onwuzulike; onyeisi ọchịchị Enugwu-Aguleri, bụ Maazị Victor Emeka; onyeisi ọchịchị obodo Umueri, bụ Maazị Jonny Metchie, tinyéré ụfọdụ ndị ọzọ.

A nọrọ na mmemme ahụ kpekwa ekpere maka nhọpụta ọchịchị izugbe ahụ a ga-eme n'afọ na-abịa abịa n'ala Nigeria; gbaa egwu mmanwụ na egwu ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche, ñụọ ma rikwa gwoogwoo nke mere ka ya bụ emume zaa aha a kpọrọ ya n'ezie. A nọkwazị̀rị̀ na ya bụ mmemme nye ụfọdụ ndị mmadụ onyinye nkwanyeùgwù dị icheiche site n'aka eze ọdịnala Enugwu-Aguleri, bụ Eze Chukwuemeka Eri.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484