Ndị Anambra bi Lagos emeela emume ụbọchị omenala afọ 2022

Dec 1, 2022 - 07:26
 0
Ndị Anambra bi Lagos emeela emume ụbọchị omenala afọ 2022

Izunna Okafor dere akụkọ a


Òtù jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi na steeti Lagos nọrọ na nsonso a wee merùbe emume Ụbọchị Omenala, nke afọ 2022.

Ya bụ oké mmemme bụ nke ha na-eme kwà afọ ọbụla, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ogige ‘Police College’ dị n'Ikeja bụ isi obodo steeti Lagos.

Mmemme ahụ dọtàkwàrà ọtụtụ ụmụafọ steeti Anambra bigasị mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke a chịkọ̀bara site n'aka ndị òtù jikọtara ndị Anambra bi na steeti ahụ, bụ ndị a kpọrọ ‘Anambra State Development Union’. A nọrọ ebe ahụ, rie, ṅụọ, ma gosipụtakwa ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Anambra; tinyéré ihe ndị ọzọ dị icheiche e mere iji kwalite ọdịmma ha na ọnọdụ mmepe steeti Anambra.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi izugbe òtù ‘Anambra State Development Union’, Maazị Amechi Ebeledike, kọwàrà na otu n'ime ebumnobi mmemme omenafọ ahụ bụ iji gosipụta ma kwalitekwa omenala dị icheiche e jiri mara ndị Anambra
 
Na nkụzi o nyere n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kèlèrè ụmụafọ steeti Anambra bi na Lagos ahụ na ebe ndị ọzọ dị icheiche tụnyegoro ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji kwalite ọdịmma steeti ahụ na iji belata ajọ ọnọdụ nchekwa na ihe ndị ọzọ na-echere steeti ahụ aka mgba.

Gọvanọ Soludo, nke onye nọchitere anya ya n'ebe ahụ bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasara ụlọọrụ Anambra n'ebe dị icheiche, bụ Ọkaiwu Leo Chiegboka kwuru na gọọmenti Anambra bu ọdịmma steeti ahụ na ụmụafọ ya n'obi, ma na-agbasikwa mbọ ike ịkwàlite ya. O kelèkwàzị̀rị̀ ndị chịkọbara ụdị ọmarịcha mmemme ahụ, gwa ha ka ha jide ka ha ji; ma kọwaa mkpa ọ dị ịdị na-egosipụta ma na-akwàlite asụsụ Igbo na Omenala dị icheiche e jiri mara ndị Igbo.

N'ịga n'ihu, ya bụ Gọvanọ kewèrè nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịtụpụta na ịbàgide n'ọmarịcha atụmatụ dị icheiche ga-akwàlite ezi ọnọdụ obibindụ Ndị Anambra, nakwa agamnihu nke mmepe steeti ahụ n'izugbe. Ọ kpọkuru ụmụafọ steeti ahụ nọgasị n'ebe dị iche iche ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nkwàdo iji kwụdosie ike n'ezi ọrụ dị icheiche o ji n'aka na steeti ahụ.

Ka ọ na-echètara ha na ọ bụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya, aka na-achị achị bụ Obianọ jikwara ohere ahụ wee dụọ ndị ahụ nà ndị Anambra bigasị n'ebe ndị ọzọ dị icheiche ka ha welataruo àkụ ha ụlọ, site n'iwunye akụnụba ha, ụlọ mmepụta ngwọ ahịa, ụlọọrụ, nakwa ihe mwunye ndị ọzọ dị icheiche n'ime steeti Anambra, iji kwalite ọnọdụ akpa ego nà mmepe steeti ahụ, ma kewàpụtakwara ụmụnne ha bụ ndị ntorobịa Anambra ohère ọrụ.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi otu ‘Anambra State Town Union (ASATU)’, bụ Maazị Titus Akpudo; eze ọdịnala obodo Ojoto, Igwe Gerald Mbamalu, na Ọkaiwu Ben Chukwukelu, kọwàrà na mmemme ahụ bụ nke magburu onwe ya ma kwesikwa ka a kwado ya. Ha dụkwàrà ndị nne na nna ọdụ ka ha na-ahapụ̀ ụmụ ha ka ha na-aga ma na-esonye n'ụdị ọmarịcha mmemme dị etu ahụ; ma nyekwazie ndụmọdụ ka a gaa n'ihu ime ya bụ mmemme ka ọ na-adawanye ụda karịa, n'afọ ndị na-abịa n'ihu.
 
A nọrọ na ya bụ mmemme ahụ gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche e jiri  mara ndị Anambra, tinyéré oriri na ọṅụṅụ pụrụ iche e jiri mee ka ya bụ mmemme dịkwa afọ mma ka ọ dị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484