Ndị Aguata etoola Soludo maka ọrụ okporoụzọ, jaa ya ike

Dec 1, 2022 - 07:42
 0
Ndị Aguata etoola Soludo maka ọrụ okporoụzọ, jaa ya ike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụmụafọ obodo Igboukwu, Osuọfia, Ikenga na Ekwulobia dị n'okpuruọchịchị ime obodo Aguata nke steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo maka ezi ọrụ ya na ịgba mbọ ya n'ịkwàlitè ọnọdụ mmepe steeti ahụ, bụkwa nke o gosipụ̀tàgòrò site n'ọrụ okporoụzọ ọ gbapegoro na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ na nsonso a.

Ndị obodo ahụ, nke gụnyere Ukamaka Ezeoke, Maazị Emmanuel Mmadumere, Maazị Anthony Oraekwe na Maazị Anthonia Nwokoye-Amuma kwupụtàrà ozi ekele ha ahụ oge ndị ntaakụkọ gbàrà ha ajụjụọnụ na nsonso banyere ya ọrụ si agawanye n'ihu n'ogologo okporoụzọ Igboukwu-Ikenga-Isuiofia-Ekwulobia, bụ otu n'ime okporoụzọ ọchịchị steeti ahụ malitere ọrụ na ya na nsonso a.

Ha tòrò Gọvanọ Soludo dịka nwoke nwere ezi ebumnobi inye ndị Anambra ezi ọnọdụ okporoụzọ bụ ịgba, dịka o kwèrè na nkwà oge ọ na-achụ nta nkwàdó, ma bụrụkwa nke ọ malitegoro imezupute.

Ha kọrọ akụkọ banyere ihe nhịahụ na ihe iche aka mgba dị icheiche ha na-agabiga n'okporoụzọ ahụ n'oge mbụ, ọkachasị n'oge udummiri; ma kwupụta olileanya ha nwere na ihe ndị ahụ ga-abụzị akụkọ mgbe ochie ma ọ bụrụ na a rụchaa ya bụ ụzọ, tinyéré mmepe na ọtụtụ uru ndị ọzọ nke ahụ ga-eweta na mpaghara ahụ.

Ha kèlèrè Gọvanọ Soludo maka mgbataọsọ ya,a rịọ ya ka o jisie ike n'ọrụ, ọbụladị dịka ha kwèkwàrà nkwà inye ya na ọchịchị ya ezi nkwàdó zuru okè, iji chịrị steeti ahụ ruo n'ala e kwèrè na nkwà.

Na mbụ n'okwu nke ya, onye nlekọta ọrụ ngo ahụ, bụ Injinia Salom Sawal mere ka a màrà na ya bụ okporoụzọ ga-adị njikere maka ụgbọala ịgba na ya n'ime ọnwa ekeresimesi afọ a.

O nyekwazị̀rị̀ nkọwa banyere otú ọrụ ahụ si aga, ogoogo ọ nọ na ya ugbua, na ihe ndị nke fọrọ afọ; mekwazie ka a mara na ndị bi na mpaghara ebe ahụ ga-agba na ya bụ ọmarịcha okporoụzọ dị larịị n'oge ekeresimesi a ma a rụchaa ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484