Ndị ACORA Emeela Emume Ncheta Ọgbụgba Ahọ 165 Oziọma Bàtàrà n'Ala Igbo

Ndị ACORA Emeela Emume Ncheta Ọgbụgba Ahọ 165 Oziọma Bàtàrà n'Ala Igbo


Izunna Okafor dere akụkọ a


A dụọla ndị otu Kraịst ọdụ ka ha bụrụ ndị ga na-enye aka n'ịgbasà oziọma nke alaeze eluigwe, ma bụrụkwa ndị ga-ejigidesi ya bụ oziọma ike, iji kụtara Kraịst mkpụrụobi, n'agbànyeghị ihe dị icheiche ọ ga-ewè ha.

Ụkọchukwu Kanọn Ugo John Okoli bụ ya kpọrọ òkù a n'okwuchukwu ya n'ofufenrò e jiri merùbé mmemme ncheta ọgbụgba ahọ otu narị na iri ise (165) oziọma jiri bata n'ala Igbo, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka Anglican Church of Redemption, dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụkwa nke e merùbere ụbọchị Wenezdee.

O mere ka a mara na mmemmé ahụ bụ nnukwu mmemme pụrụ iche a nà-eme n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Julaị ahọ ọbụla, ọkachasị iji cheta mbọ dị icheiche ndị wetara oziọma n'ala Igbo gbara iji mee ka ya bụ oziọma ruo ụmụ mmadụ aka, rụtụ aka n'ihe dị icheiche ha gabigara iji weta ya bụ oziọma, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ gbaa ndị òtù Kraịst ume.

Ya bụ ụkọchukwu, onye kọrọ akụkọ etu oziọma siri bata Afrịka, wee megide gbadataruo ala Igbo, gàkwàrà n'ihu kpọpụtasịa ọtụtụ uru, mgbanwe na mmepe dị icheiche oziọma wetaara ụmụ mmadụ, ọkachasị ndị Igbo.

N'ịgbakwasà ụkwụ n'akwụkwọ Matiu 24:14, ọ dụ̀kwaziri ndị òtù Kraịst ọdụ ka ha nye aka ma tụnyekwa ụtụ nke ha n'ịgbasà oziọma nke ìhè ahụ, n'ihi na ọtụtụ ndị ka nọ n'ọchịchịrị ugbua, bụ ndị amaghị Chineke. O kwukwàrà na Kraịst enyela ndị òtù Ya ike na ntụziaka ịgbasa oziọma ahụ ruo mba niile, tinyekwuoro na akụrụngwa na ihe ndị ọzọ ga-eji mee nke ahụ dị ugbua, naanị na ọ fọdụrụ ndị ga-ewepụ̀ta onwe ha, ma nye oge ha, na ihe ha nwere maka oziọma ahụ, dịka ndị mbụ wetere ya siri mee.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, onyeisi nchụaja ụlọụka ahụ, bụ Ven. Obiorah Alokwu; na onyeisi òtù pụrụ iche hụrụ maka nhazi ụbọchị ahụ, bụ Maazị John Ifejika kèlèrè ndị dị icheiche bịara ya bụ mmemme, nàkwà ndị nyere aka maọbụ tụnye ụtụ n'ótù ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ mmemme gara nke ọma na n'ụzọ dara ụda, ọbụladị dịka ha kpere ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.

Mmemme ahụ, nke ụkọchukwu Lucky Onebunne nọ̀ n'isi ya bụkwa nke ndị mmadụ jupụtàrà n'ìgwè wee sonye na ya, ma bụrụkwa nke e jiri naanị asụsụ Igbo wee merùbé, malite na mbido ya, ruo na njedobe.

A nọrọ na ya bụ òfùfènro mee ihe ngosi dị icheiche, nke gụnyere ịgba egwu site n'aka òtù ndị nne, ịgba egwu na ịkọ akụkọ ntọala banyere etu oziọma siri bata n'ala Igbo nàkwà ọnọdụ ụka Anglịkan n'ala Nigeria ugbua, bụ nkè e mèrè site n'aka ụmụntakịrị ụlọụka ahụ.

A nọkwàrà na mmemme ahụ nwee asọmpi ajụọazaa maka ihe banyere ụka Anglịkan na akwụkwọnsọ, bụ nke onye nochitere anya ndị ntorobịa n'asọmpi ahụ, bụ Chidera Isikaku tuuru ugo dịka onye nke mbụ na ya; onye nọchiri anya ụmụnwaanyị ụlọụka ahụ, bụ Ọ̀kammụ̀ta Nkọlị Nnyigide gbara onye nke abụọ; ebe onye nọchiri anya òtù ndị otiegwu ụlọuka ahụ, bụ Akachi Orji gbara onye nke atọ. N'asọmpi ahụ, onye nọchiri anya ndị ọbụabụ ụlọụka ahụ, bụ Chukwunyerem Unonu gbara onye nke anọ; ebe onye nọchiri anya ụmụnwoke ụlọụka ahụ, bụ Uche Uwaezuoke gbara onye nke ikpeazụ.

A nọkwàrà na mmemme ahụ bụọ abụ ofùfè nà abụ otuto dị icheiche, waa achịcha bekee, ma mekwa emume ịkụ ngazị n'eze, ihe ndị ọzọ mere ya ka ọ dị ebube.