N'Awka, Ụlọakwụkwọ Aquinas Emeela Emume Ngụcha Akwụkwọ Ahọ 2022

N'Awka, Ụlọakwụkwọ Aquinas Emeela Emume Ngụcha Akwụkwọ Ahọ 2022

 Chinwendu Uzoatu

 Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma bụrụ ihe ọṅụ ka ụlọakwụkwọ, Aquinas Nursery/Primary School, GRA, Awka nke dị na St. Thomas Aquinas Parish mere emume nturuugo mmụta, nke bụ omenahọ a na-eme n'ụlọakwụkwọ ọbụla.
 E ji àjà maasị dị asọ wee malite mmemme ahụ nke ụfọdụ ụmụakwụkwọ nọ na ya wee nata oriri dị asọ nke izizi na ndụ ha.

 N'okwu ya na mmemme ahụ onyeisi ụlọakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ ma bụrụkwa onye na-esote ụkọchukwu parish ahụ, bụ Fada Clement lgwegbe kèlèrè Chineke maka amara Ya, nke mere ka a hazie emume ahụ. O toro ndị natara oriri izizi, tinyekwara ndị tuuru ugo mmụta, ma gakwa n'ihu kelee ndị kwadoro ha. O chefughị ụkọchukwu parish ahụ bụ Fada Francis Oranye maka mbọ ya, tinyere onye ya na ya chụrụ àjà maasị ahụ, Fada Blaise Ejike.
 N'ajụjụọnụ a gbara ya, ụkọchukwụ nọrọ n'isi emume, onye nyere ụmụaka oriri izizi, ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka onye nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ oge ọ nọ na parish Aquinas bụ Fada Ejike, dụrụ  ụmụaka ahụ natara oriri izizi ọdụ ka ha gba mbọ hụ na ìhè Kristi nke a mụghere n'ime ha ụbọchị ahụ nwugidere, ka ọ ghara ịnyụ anyụ. 
 Ọ gakwara n'ihu sị: "Nne na nna ga-enyere ha aka iji hụ na ihe ahụ nwugidere ụbọchị ndụ ha niile."
   Fada Ejike gọkwaara ndị tuuru ugo mmụta ọfọ ka ha nweta ihe ha chọrọ na ndụ, ma kpekwa ka ụlọakwụkwọ ahụ si n'ike  na-aba n'ike.
 N'okwu nke ha, ụfọdụ ụmụaka ahụ natara oriri dị asọ izizi, ndị gụnyere Chikamso Orakwe, Chukwudalu Nwizugbo, Chukwuemeka Uzoigwe na Adanna Emmagbodike gosipụtara ọṅụ n'ebe ọ dị ukwuu, kọwaa ụbọchị ahụ dịka oke ụbọchị na ndụ ha ma kpọkuo ndị anatabeghị oriri ka ha jiri nkụzi Katikizim a na-akụziri ha wee kpọrọ ihe.
 Otu onye nọ njem ichi ụkọchukwu, ma bụrụ onye kwadoro ụmụaka ahụ dịka ọ nọ ọrụ dịka Onyeozi (Apostle) n'Aquinas, Emmanuel Okonkwo kwuru: "Ọ dịghị mfe, n'ime ihe niile anyị na-ekele Chineke maka amara ya nke mere ka ihe niile bịa na mmezu taa.” Ọ gakwara n'ihu kelee ndị ụkọchukwu.
  N'akụkụ nke ya, otu onyenkuzi n'ụlọakwụkwọ ahụ, onye kwadoro ma gbaziere ụmụaka ahụ natara oriri izizi, Oriaku Jovita lkedianya sị: "Taa bụ ụbọchị pụrụ nnukwu iche na ndụ ha n'ihi na ha natara oriri dị asọ izizi, nke a na-eme otu ugboro na ndụ. Ọ bụ na ya ka ha ga-amalite njem nke mmụọ. O so na sakaramenti kacha mkpa n'ụka Katọlik.”
 Chinedu Ughachukwu na Cyril lgbojiuba, ndị tuuru ugo mmụta na prima nke isii, kwuru na ha ga-abụ Dọkịta na Injinia n'otu n'otu iji mee ka obodo na-aga n'ihu. Dịka ha na-ejikere ịbà sekọndịrị, ha gọọrọ onwe ha ọfọ ka ha bụrụ ọkachamma ebe ahụ.
 Maazị Ebere Ambrose Ezeoke, onye nwa ya nwoke, Sochikayima Ezeoke tuuru ugo mmụta na ntaakara (nursery) kwuru na ya nọ na ntọala ụlọakwụkwọ ahụ n'ihi na nwanne ya nwoke bụ Fada Anthony Ezeoke bụ ụkọchukwu parish nke mbụ n'Aquinas. Ọ sị: "Amaghị m na ụmụ m ga-emecha gụọ ebe a. Ụlọakwụkwọ a na-eme nke ọma. Ọ bụ eziokwu na Ada m nwaanyị, Ifunanya Ezeoke na-agba onye nke mbụ n'ụlọakwkwọ ebe ọ na-agụ na mbụ, ma mgbe ọ bịara ebe e, achọpụtakwara m nnukwu ihe dị iche. Ha na-akụziri ma na-agbaziri ụmụaka nke ọma."
 A nọ n'emume ahụ waa achịcha bekee, tinyere ihe ngosi dị icheiche e mere ebe ahụ, nke gụnyere egwu ọdịnala, ejije, ejiji njirimara ndị lgbo wdg, nke mere ka ọ daa ụda.