N'Awka, Odide Ebidola Ọrụ Mmetụaka n'Okporoụzọ Mebiri Emebi

Aug 11, 2022 - 10:05
 0
N'Awka, Odide Ebidola Ọrụ Mmetụaka n'Okporoụzọ Mebiri Emebi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyi, ọ dị mfe; maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja.

Ka ọ dị taa, otu nwaamadi ọrụ obiebere na-atọ ụtọ, bụ Maazị Ikechukwu Odide ebidola ọrụ mmetụaka na mpaghara ebe ahụ mebiri emebi n'okporoụzọ ahụ e si abanye ime ogige Commissioners Quarters dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ọrụ mmetụaka bụ nke a malitere na nsonso a, ma bụrụkwa nke na-agawanye n'ihu ugbua, dịka a hụrụ ụfọdụ ígwè ọrụ na ndị ọrụ ka ha na-agawanye n'ihu n'arụmọrụ ha ebe ahụ.

Dịka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ ugbua, e dozigharịala ọ̀wammiri mebiri emebi n'ebe ahụ, ma ka na-arụgharị ụfọdụ mpaghara ebe mebisiri emebi n'okporoụzọ ahụ, iji mee ka ọ dịkwa larịị ọzọ ma dịkwa mma ụkwụ na mma ụgbọala. Ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, nke gụnyere Osote Gọvanọ, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim, na ndị ọzọ, agaala njem nleta n'ebe ahụ ịhụ ka ya bụ ọrụ si aga; bụkwa ebe ha nọrọ wee too Maazị Odide maka ya bụ ezi ọrụ obiebere.

N'okwu ya banyere nke ahụ, ya bụ nwaamadi na-arụ ya bụ ọrụ ma bụrụkwa onyeisioche ụlọọrụ ngo ji ya bụ ọrụ, bụ Maazị Odide kọwàrà na ọ malitere ya n'ihi mkpa ọ hụtara ya bụ okporoụzọ dị na etu ọnọdụ ya bụ ụzọ dị, ma mekwa ka a mara na Osote Gọvanọ, Dọkịta Ibezim bụ ezi enyi ya, nke bụkwa otu n'ime ihe kpaliri ya ịbagide na ya bụ ọrụ.

O mere ka a mara na nke ahụ bụ otu n'ime ụzọ o siri kpebie inye aka na ịtụnye ụtụ n'ịkwàlite mmepe obodo na steeti ya.

O kwupụtàrà olileanya o nwere ịgbatịwanye ya bụ ọrụ ka o rutekwa ebe ndị ọzọ, ọbụladị dịka o kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka inye ya ohere ahụ iji tụnye ụtụ na mmepe steeti ya; ma kwe nkwa iji obi ya niile rụọ ya bụ ọrụ n'ogoogo dị elu karịa ka a tụrụ anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484