N'Awka, Ndị Ụlọụka ACORA Enweela Ukwe Njirimara Ọhụrụ

N'Awka, Ndị Ụlọụka ACORA Enweela Ukwe Njirimara Ọhụrụ

 


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụ̀rụ̀ akpọtụ n'ụlọuka ‘Anglican Church of Redemption’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị ụka, dịka ndị ụlọụka ahụ jiri obiụtọ na wee mụ̀ọ́ ma nabata ukwe njirimara ọhụrụ nke ụlọụka ahụ.

Ukwe ahụ, nke a kpọrọ “Redemption Ground” bụ nke mbụ na mbụ ụlọụka ahụ nwegoro kemgbe ntọala ya, ma bụrụkwa nke ọ bụ Ọ̀kàmmụta Alvan-Ikoku Nwamara nke Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, dere ya, wepụta ya, ma kụziere ya ndị mmadụ ụbọchị ụka gara aga.

Ọkammụta Nwamara, ónyé kọwara ma gụpụtakwara ederede nke ukwe ahụ, kụzikwààrà ndị mmadụ etu e si agụ ya dịka egwu, bụ́kwá nke ndị ọbụabụ na ndị otiegwu nke ụlọuka  jiri olu ọma na ngwaegwu wee hazie, o wee tọọ ka mmanụañụ.

N'okwu ya banyere ukwe ahụ, onyeisi nchụaja n'ụlọụka ahụ, bụ, Ven. Dkt. Obiora Alokwu fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye nwa amadi ahụ dere ya bụ ukwe, bụ Ọ̀kàmmụta Nwamara, nà ndị ọbụabụ na ndị otiegwu ụlọuka ahụ, nàkwà ndị ọzọ nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ n'iwepụ̀ta ya bụ ọmarịcha ukwe njirimara.

Dịka ọ na-enyekwu nkọwa gbasara ukwe ahụ, ọ gara n’ihu gwa ndị ụka ahụ ka ha mụta ya bụ ukwe ma burukwa ya n’isi, n’ihi na a ga na-agụ ya na mgbe na mgbe n’ụlọụka ahụ.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ofufenrò ahụ, nke isiokwu ya bụ “Ibi Ndụ Dịka Ụmụ Nke Ìhè”, Ọdịnandị Justice Chukwukasi gbàdòrò ụkwụ n'ụfọdụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ wee dụọ ndị ụka ọdụ ka ha na-ebi ndụ ha dịka ụmụ nke ìhè, site n'ịnabata Kraịst, onye bụ Ìhè, ka O wee bata ma gosipụta obibindụ Ya n'ime ha.

A nọkwazị̀rị̀ n'ofufenrò ahụ wee kpee usoro ekpere dị icheiche, bụọ abụ ofùfè nà abụ otùtó dị icheiche sitere n'aka ndị ọbụabụ na ndị otiegwu ụlọuka ahụ.