N'Anambra, Ụmụnwaanyị Emeela Ngagharịiwe n'Ihi Agadi Nwaanyị E Gburu Maka Ọgwụ Ego

Izunna Okafor dere akụkọ a
Ụmụnwaanyị obodo Ụmụnze dị n'okpuruọchịchị ime obodo Orumba South nke steeti Anambra emeela ngagharịiwe banyere ọnwụ otu agadi nwaanyị, onye nwụrụ oge nwa njeozi ya bekọ̀rọ̀chara ụfọdụ akụkụ ahụ ya maka iji ya gwọọ ọgwụ ego.
Ụmụnwaanyị ahụ karịrị otu narị n'ọnụọgụgụ mèrè ya bụ ngagharịiwe ụbọchị Tuzdee izuụka a ka ya bụ nwaanyị nwụ̀chara n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anara ọgwụgwọ n’Ụlọ Ahụike Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n'Amakụ Awka mgbe ya bụ ihe mèchàrà.
Dịka akụkọ siri kọọ, nwaanyị ahụ, bụ Oriakụ Charity (gbara afọ iri asaa na abụọ) bụ onye ụfọdụ ụmụokorobịa wakpòrò n'ime ụlọ ya n'Ụmụnze, wee bekọ̀rọ̀sịa ụfọdụ akụkụ ahụ ya, nke gụnyere ọnụ ara ya, mkpịsị-aka ya, ntị, akụkụ ahụ nwaanyị ya, tinyere ụfọdụ akụkụ ahụ nwaanyị y, ka ha wee jiri ihe ndị ahụ wee ga gwọọ ọgwụ ego. E mèchààrà jide otu n'ime ndị ahụ kpara arụ ahụ, bụ nwa njeozi nwaanyị ahụ, onye duru ụmụokorobịa ndị ọzọ wee bagide n'ajọ ọrụ ahụ.
Ka e jidechara ya, nwa amadi ahụ, bụ Maazị Onyebuchi Ezeh, ọ kọwàrà na ọ bụ dibịa ha gara na nke ya ka ọ gwọọrọ ha ọgwụ ego gwàrà ha wetasịa akụkụ ahụ nwaanyị ahụ ka e jiri gwọọrọ ma hị̀àkwáárá ha ya bụ ọgwụ ego. Mgbe ha wakpòchàrà nwaanyị ahụ ma werechaa ihe ha chọrọ bịa, ha bihapụ̀rụ̀ ya n'ime ụlọ ahụ, pụọrọ onwe ha. Ọ bụzị ụfọdụ ndị obi ebere bịara n'ime ụlọ ahụ oge ha nụrụ iti mkpu akwa ya, wee sizie ebe ahụ buru ya gaba ụlọọgwụ ozigbo maka inye ya ezi nlekọta.
Kaosiladị, ya bụ nwaanyị mèchàziere nwụọ n'ime izuụka a n'ụlọọgwụ ahụ ọ nọ anara ọgwụgwọ. Ọ bụzị nke a mere ụmụnwaanyị obodo ahụ jiri nupụ̀ta n'ìgwè, wee jiri otu olu katọ̀ọ́ ihe ahụ dịka nnukwu arụ jọgburu onwe ya.
N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere arụrụala ahụ, onyeisi ụmụnwaanyị ahụ, bụ Oriakụ Bridget Enekwechi kwuru na onye nọ n'isi arụrụala ahụ bụ nwaafọ Abakaliki dị na steeti Ebonyi, Maazị Ezeh; ma kwuo na o teela ndị Abakaliki bi n'obodo ahu siri rụba arụrụala ma na-etinyesi aka n'ụdị ihe dị icheiche na-asọ ntị oyi, nke gụnyere izu ohi, ịtụbasị ụmụagbọghọ ime, ikwasò ụmụnwaanyị iko n'ike, tinyéré ọtụtụ nkwafu ọbara na ihe ọjọọ na-ebute ala adịghị mma o kwuru na ha na-eme n'obodo ahụ.
Oriakụ Enekwechi kwukwazị̀rị̀ na ihe ọjọọ ndị ahụ akarịala, ma kpọọ òkù ka a chụsịa ndị Abakaliki niile bi n'obodo ahụ ka ha kwakọrọ ngwongwo ha pụọ n'Ụmụnze kpamkpam.
N'okwu ha n'otu n'otu, Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị na Eze Ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe katọ̀rọ̀ ụdị arụrụala dị etu ahụ, kpọpụtasịa usoro dị icheiche ha bagidègoro nà nkè ha ji n'aka ugbua, iji gbochie ụdị ihe ahụ ịdapụta ọzọ n'ọdịnihu, ya na iji hụ na nwaanyị na ndị ezinụlọ ya nwètèrè ikpe nkwụmọtọ, ọbụnadị ma ugbua ya bụ nwaanyị nwụ̀goro.
Ha dụkwàzị̀rị̀ ụmụnwaanyị ahụ ka ha butuo iwe ha; ma kwezie nkwa na ha onwe ha agaghị ezukwa ike wee ruo mgbe e mèchàrà ihe dị n'okwu ahụ ma ma nyekwa ndị ahụ ikpe mara ntaramahụhụ kwesiri ha.
What's Your Reaction?






