N'Anambra, Ndị Uweojii Ebutela Ụgbọala Ndị Ohi Hapụrụ Ebe Ha Nwere Ihe Mberede Okporoụzọ

Aug 31, 2022 - 08:43
 0
N'Anambra, Ndị Uweojii Ebutela Ụgbọala Ndị Ohi Hapụrụ Ebe Ha Nwere Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii n'ime steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee bute otu ụgbọala ndị omekome gbahapụ̀rụ̀ ebe ha nwere ihe mberede okporoụzọ wee rie mbọmbọ ọsọ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Ikenga Tochukwu bụ ya kwupụtàrà nke a n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ na steeti ahụ n'ime izuụka a. O mere ka a mara na ọ bụ oge ndị ọrụ ha nọ̀ n'ọrụ mkpagharị ka ha hụrụ ụgbọala ahụ ebe a gbahapụ̀rụ̀ ya n'ogologo okporoụzọ ahụ siri Amaọkpara gaa Awgbu, n'okpuruọchịchị Orumba South.

O mere ka a mara na ozi ha nwetere na-akọwa na ndị omekome ahụ pụnààrà onye nwe ahụ ụgbọala ya, wee jiri ya nwee ihe mberede okporoụzọ oge ha ji ya aga ọrụ, nke mezịrị ka ha gbahapụ ya ebe ọ danyere n'ọ̀wà mmiri.

O kwuru na ụgbọala ahụ bụ Mercedes Benz 4matic ML 350 oji nwéré aka ‘Abuja RBC 527 AL’.

Ọ kọwàrà na ha nwetèkwàrà mgbọ egbe AK47 n'ime ụgbọala ahụ, tinyéré ihe ndị ohi ji ekpuchi ihu ha nwetèkwàrà n'ime ya; ọbụladị dịka ọ kpọkuru onye na-achọ ụdị ụgbọala ya dị otú ahụ achọ ka o jiri ihe gosiri na ọ bụ ya nwe ụgbọala ahụ wee bịa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n'Amawbia bịa buru ụgbọala ya.

Ọ sị na ndị ọrụ ha ewelitekwuola aka n'otu ha sị eme mkpagharị na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, ma kwukwa na ha na-agbasi mbọ ike iji nwụchikọọ ndị omekome ahụ gbahapụ̀rụ̀ ya bụ ụgbọala.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484