N'Anambra, ndị Okpuno Ebidola Ọrụ Mmetụaka n'Okporoụzọ Ha

Jul 7, 2022 - 06:25
 0
N'Anambra, ndị Okpuno Ebidola Ọrụ Mmetụaka n'Okporoụzọ Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyi, ọ dị mfe; maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja.

Ka ọ dị taa, ndị obodo Okpuno dị n'okpuruọchịchị Awka South nke steeti Anambra ebidola ọrụ mmetụaka n'ụfọdụ okporoụzọ dị n'obodo ahụ nwegasịrị nsogbu.

Ya bụ ọrụ okporoụzọ bụ nke ha na-arụ na mpaghara njikọụzọ Y-Junction, mpaghara njikọụzọ Goodwill, ya na mpaghara okporoụzọ ahụ siri Goodwill gaa Isuaniọcha na Mgbakwụ, ma bụrụkwa nke a na-arụ site na nkwàdo ndị òtù ‘Okpuno Town Union’. 

Ndị obodo ahụ malitere ịrụ ka ọ gachara ihe dị ka otu izuụka aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Soludo kpọkuru ma dụọ ndị obodo dị icheiche na steeti ọdụ ka ha ghọta mkpa ọ dị inyere gọọmenti aka n'ịkwalite mmepe obodo, site n'iji aka ha rụọ okporoụzọ na ụfọdụ ndị ọzọ adịchaghị etu ha siri kwesi n'obodo ha dị icheiche, maka na ọrụ chere gọọmenti n'ihu dị ọtụtụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ignatius Okoye kwuru na ha kpebiri ịrụ ya bụ okporoụzọ n'ihi ajọ ọnọdụ ọ nọ na ya maka oke ọnụọgụgụ ụgbọala na-agba na ya oge niile, tinyekwuoro na a na-enwekarị agbakata akwụrụ na ya kwa ụbọchị ọbụla.

Dịka o siri kwuo, ọchịchị obodo ahụ wepụtara nde naịra atọ maka ịrụ ya bụ ọrụ ndozi okporoụzọ, bụ nke o kwuru na ọ gaghị ezu; ma kpọkuo gọọmenti ka o nye aka n'idozi okporoụzọ nke ahụ siri njikọụzọ Goodwill gaa Nodu-Okpụnọ bụkwa nke mebisigoro kemgbe ma na-emezịkwa ka e nwee oke agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ndị ọzọ dị na mpaghara ahụ.

N'okwu nke ya, otu nwaafọ obodo ahụ, bụ Maazị Chinedu Okey kwuru na otu n'ime ihe kpaliri ha ha jiri malite ọrụ ahụ bụ okwu Gọvanọ Soludo kwuru ụbọchị Wenezdee izuụka gara aga n'ụlọ mgbasaozi oge ya na ndị Anambra na-enwe mkparịtaụka, bụ nke mezịrị ha jiri hụta mkpa ọ dị ịtụnyekwa ụtụ nke ha n'ịkwalite mmepe, n'ahapụrụghị ya naanị gọọmenti.

O mere ka a mara na ihe ahụ ha na-arụ bụ ọrụ mmetụaka, iji mee ka ọnọdụ okporoụzọ ahụ dịtụ mma; ma kpọkuzie gọọmenti ka ọ gbatakwa ọsọ enyemaka n'ịrụzigharị okporoụzọ ahụ, n'ihi na ọ bụ naanị ya bụ okporoụzọ e si abanye n'ime obodo dị icheiche dị n'okpuruọchịchị Awka North site n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484