N'Anambra, Ndị Obodo Ejidela Onye Ojiegbe, Gbaa Ya Ọtọ n'Ahịa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụmụ mmadụ ji anya ha gbara ekeresimesi n'ahịa Nkwọ Ụga dị n'obodo Uga, n'okpuruọchịchị ime obodo Aguata nke Steeti Anambra na nsonso a, dịka ndị obodo jikọrọ aka wee nwụchie otu n'ime ndị ojiegbe na-eyi ndị mmadụ égwù na mpaghara ahụ, ma gbàá ya ọtọ.

Akụkọ kọrọ na ndị ojiegbe ahụ bù ụgbọala wụ̀cháá n'ahịa ahụ, wee malite ọrụ ozigbo, bido ịwakporo ndị mmadụ, bidokwa ịgbalisi egbe elu iji chụsàsịa ndị nọ ebe ahụ, ọbụladị dịka ha napụrụkwa ụfọdụ ndị na-agba Ọkada ọgbatumtum ha.

Otu onye ọnọmgbeomere kwuru na ozigbo ụfọdụ ndị ojiegbe ahụ buru ọgbatumtum ahụ ha zutere wee gbafuo, dịka ndị ntorobịa na-apụ̀ta ịwakpo ha; onye nke na-anya ụgbọala ha ahụ bụzị̀ onye e kweere ọnya site n'iji ígwè wee dochisie okporoụzọ ebe ụgbọala ya ga-esi pụọ, o wee tọ ebe ahụ, nke mezịrị ka ọ matuo n'ike, ma chọọ ka o tinye isi n'ọhịa dị nso n'ebe ahụ, ụmụokorobịa ahụ wee nwụchikọọ ya ozigbo.

Ọtụtụ ihe ngosi vidio e mèkwàrà n'ebe ahụ bụkwazị nke gbasàgoro ka mkpụrụ ụkpaka ugbua n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, ma na-egosi ebe ndị obodo gbara ya bụ onye chi ọjọọ okirikiri ma na-agba ya ajụjụọnụ. Tupu mgbe ahụ, ha egbujiela ya otu ụkwụ, ebe ọ bugasịkwa ọbara na àpà n'isi, n'ihu, nà n'ụfọdụ akụkụ ahụ ya ndị ọzọ dị icheiche n'ihi na ya ahọ̀ọ́la ya aka ururu họrọ ogbe ogiri. 

Onye ọnọmgbeomere ahụ kwukwàrà na ndị ahụ chọdịrị ka ha gbaa ya ọkụ ozigbo ahụ, mana a dụrụ ha ọdụ ka ha gbagodi ya ajụjụọnụ, kama igbu ya ozigbo, maka na ha etielarị̀ ya gwoogwoo mgbe ahụ.

N'okwu ya mgbe a na-agba ya ajụjụọnụ, ya bụ onye ojiegbe kwùrù na o si n'ótù obodo dị n’okpuruọchịchị ime obodo Nnewi South nke steeti Anambra, ma kwukwa na ọ na-eme mpụ ahụ n'eziokwu, ọbụladị dịka ọ gàrà n'ihu kpughee ihe ụfọdụ banyere onyeisi ha na onye na-agwọrọ ha ọgwụ.

Ndị obodo ahụ niile nọ ebe ahụ jiri oké olu wee tie mkpu n'ịtụ́nanya ngwangwa ha hụrụ ọtụtụ nwoke ahụ kere n'úkwù na n'obi oge e yipuru ya akwa ya n'ebe ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, odeakwụkwọ mgbasaozi nyégárá aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, Maazị Christian Aburime gwara ndị Anambra na gọọmentị na-agbasi mbọ ike iji hụ na e weghachitere ezi nchekwa ndụ na akụnụba zuru òkè na steeti ahụ; ma kpọkuo ha ka ha gaa n'ihu na-akwàdo gọọmentị n'ọgụ ahụ ọ na-ebu megide mpụ na arụrụala na steeti ahụ site n'inye mkpesa ozigbo n'aka ndị ọrụ nchekwa na ụlọọrụ gọọmenti banyere onye maọbụ akparamagwa ọbụla a na-enyo enyo, bụ nke ha pụrụ ime site n'ịkpọtụrụ otu n'ime ákàrà ekwentị ahụ e wepụtagasịrị na nsonso a maka nke ahụ.

O tòrò ndị Anambra maka nkwàdó ha nyegooro gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa ruo ugbua n'ịlụ ọgụ megide mpụ na steeti ahụ; ọbụladị dịka o jikwara ohere ahụ nye ndụmọdụ ka ndị mmadụ nyefee onye ọbụla a na-enyo enyo ha jidere n'aka ndị ọrụ nchekwa maka ime nnyocha zuru oke na ikpe onye ahụ ikpe, karịa ha iji aka ha tigbuo onye ahụ ozigbo.

O kwèkwàrà nkwà na gọọmentị agaghị ada mbà n'ọgụ ahụ ọ na-alụ imemilà mpụ na ajọ ọnọdụ nchekwa n'Anambra.

Mgbe a kpọtụụrụ ya maka okwu nke ya ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu kwèrè nkwa na ya ga-enye ozi banyere nke ahụ.

Files