N'Anambra, Ndị Achalla Emeela Emume Amanwulu n'Ụzọ Pụrụ Iche

N'Anambra, Ndị Achalla Emeela Emume Amanwulu n'Ụzọ Pụrụ Iche

Nkechi Ikenwoke dere akụkọ a

Oke ọṅụ dara n'obodo Achalla dị n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Awka North’ nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ mere otu n'ime emume e jiri mara ha, bụ umume Amanwulu, nke ahọ 2022 n'udi pụrụ iche.

Ya bụ nnukwu emume bụ nke ndị obodo ahụ na-eme n'ọnwa nke isii kwa afọ ọbụla tupu ndi ọrụ ugbo ebido igwupụ̀tà ihe ha kọrọ n'ugbo.

Mmemme ahụ bụkwa nke imirikiti ụmụafọ obodo ahụ na-esonye na ya, ma ma ndị nọ n'ụlọ ma ndị bi na mba ofesi. Ọ bụkwa iwu n'obodo ahụ na onye ọbụla ga-esonye na mmemme Amanwulu ahụ agaghị eme maọbụ tinye aka n'ihe ọbụla bụ ihe ọjọọ, nke pụtara na onye ahụ ga-adịrịrị ọcha n'omume ma bụrụkwa onye tozuru okè isonye na ya bụ mmemme. Nke a ga-egbochi iji ehi maọbụ ihe karịrị ya chuọrọ Arụsị Amanwulu aja.

N'oge a na-agba ya ajụjụọnụ na mmemme ahụ, onye Dibia ọgwụ ngbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ ma bụrụkwa onye jigoro ọkwa dịka onyeisi ọchịchị ‘Achalla Developumenti Union’ n'oge mbụ, bụ Dọkinta Charles Okadigbo Okanumee kọwàrà mmemme ahu dịka mmemme e ji enwogharị ma na-ajụ̀cha mmadụ pụọ n'ihe ọbụla bụ njọ ná ndụ ya, bụ nke ndị ụka kpọrọ ‘Baptism’ n'asụsụ Bekee.

Ọ kọwàrà na ndi a na-emere emume a bụ ụmụntakịrị, kwuo na ha ga-agba ọtọ n'ihi na ga-agụ ha aha n'oge ahụ iji sachaa ha njọ ọbụla ha metere.

O kwuru na  onye ọbụla n'ime ha ga-anọ n'ọnọdụ ọkara-agbamọtọ (half naked) ma kasịa nzu n'ahu, ma kọwaa na ọ bụ mgbanwe izizi a ga-agbanwe nwatakịrị ọbụla ka e wee tọpụta ya n'óhù; ọbụladị dịka ọ mere ka a mara na ihe ahụ bụ  nnukwu mmemme e ji akị na ukwa emerùbé na obodo ahụ ma jirikwa ya na-emere ndị ọbịa ọjị n'oge ahụ a nà-eme ya 

Maazị Okadigbo, onye bụkwa onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ọrụ ugbo n'oge mbụ,  mèkwàrà ka a mara na onye ọbụla na-enwe aṅụrị n'oge mmemme Amanwulu ahụ, ma kwuo na o nweghịkwa mmemme ọbụla ọzọ a na-eme n'oge mmemme ahụ, tinyekwuoro na a gaghi agbakwa nkpọala ma ọ bụ tie ịgba n'oge a nà-eme ya bụ emume.

Ọ sị: "Onye juru isonye na ya agaghị emetụ nzu aka maọlị, ebe onye sonyere na ya ga-enwe ikike ime omenala n'ụzọ ọbụla. Onye ọbụla na-enwe olileanya na okwukwe ya ma bụrụ ebe o kwenyere. O nwere ike ibụ n'ụka maọbụ n'omenala.

"Ana m enye ọgwụ ọrịa ọbụla n'efu. Ọ bụ onyinye efu ga-eme ka ọrịa ahụ laa. Nne na nna m anaghị ana ego n'ime ya oge ha nọ ndu tupu ha nwụọ. Agaala m mba ofesi di icheiche maka nke a, ịga gwọọ ọrịa. O nyela m ụdị onyinye amara di iche iche.”

N'okwu nke ya, Maazi Onyekachukwu Nwabunwanne ma bụrụ onye eji Ikoliko mara kwuru na Amanwulu bụ Ịgu-Aro Udo Nwaugoye, bụ nwaada izizi a mụrụ n'bodo Achalla.

Ọ sị: "Emume a bidoro n'oge nke nna-nna anyị ha. Eji m ohere a na-adụ ndi ntorobịa ibe m ọdụ ka ha kwụba aka ha ọtọ, wezuga ihe akụ nke ụwa n'akụkụ ma mee ka omenala bụrụ ihe a ga-eṅomi eṅomi. Ị ga enwe aṅụrị pụrụ iche mgbe ọbụla i nyeere mmadụ ibe gị aka. Ihe ọbụla i mere n'ụzọ akwụghị ọtọ nwèrè ọdachi na ọnwụ ike so ya.”

Okadigbo na Nwabunwanne kpekwàrà ekpere maka ịdịnotu na nchekwaba n'isi ụmụafọ Achalla niile na ndị ọbịa bịara isonye na mmemme ahụ, ma rịọkwa ka Chineke dulaa ha na udo.

N'ime oge mmemme ahụ, a hụkwara ụfọdụ ndị mmadụ ka ha na-agagharị n'ime ogbe dị icheiche dịgasị n'obodo ahụ, nke gunyere Umudiani, Amukabia, Odawa, Umuogbe, Umunagu, Umuozede, Udezu Amadim.