N'Anambra, Mmadụ Isii Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

N'Anambra, Mmadụ Isii Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ isii nọrọ na nsonso a wee zute ọnwụ mberede ha n'ihe mberede okporoụzọ abụọ mere na mpaghara ebe dị icheiche n'ime steeti Anambra.

Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) ngalaba steeti Anambra bụ RC Margaret Onabe, bụ ya kwupụtàrà nke n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ na steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, otu n'ime ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara na mpaghara Enugwu-Agidi nke okporoụzọ ochie ahụ siri Awka gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke mere oge o jiri ihe dịka nkeji iri abụọ gata elekere asaa nke abalị ụbọchị ụka. 

O kwuru na ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'etiti nnukwu ụgbọala gwongworo (enweghị akara) na obere ụgbọala Lexus RX330 Jeep (nwere ákàrà KJA182HS), ma kọwakwa na mmadụ ise, nke gụnyere nwaanyị na nwa ọhụrụ ya na mmadụ atọ ndị ọzọ, nwụ̀rụ̀ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na nwoke ahụ na-anyà ụgbọala gwongworo ahụ nọ̀ n'óké ọsọ, wee jirikwa ọsọ ahụ gbakwúnyéré ụgbọala Lexus ahụ ebe ọ na-agara onwe ya, wee suo ma kwọrikọọ ya na ndị niile nọ n'ime ya, nke na o nweghị onye ọbụla ji ndụ ya pụta.

O kwukwàrà na ndị ọrụ FRSC dọ̀nyèzịkwàrà ozu ndị ahụ n'ụlọ nchekwa ozu, ma nyekwazie aka bughasịa ihe ndị dịchisiri ụzọ n'ebe ahụ. 

N'akụkọ ọzọ dị ka ibe ya, onye ọzọ na-anyà ụgbọala gwongworo nọ̀kwàrà ụbọchị Tuzdee wee kwọrikọọ otu onye na-anyà ọgbatumtum n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na mpaghara njikọụzọ a maara dịka Building Materials Junction, dị n'Ogbunike, n'ogologo okporoụzọ awaraawara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, n'ime steeti Anambra.

RC Onabe kwuru na ihe mberede okporoụzọ ahụ mèrè oge ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere mbụ nke ehihie, ma kwukwa na ya bụ ihe mberede dapụtara oge onye ahụ na-anyà ụgbọala gwongworo (nwere ákàrà ASB280ZH) hapụzịrị aka nke ya (akụkụ ebe ọ na-agba), wee gbara bàá n'aka nke onye ọgbatumtum ahụ, wee kụrụ ya na ọgbatumtum ya deberuo ala; nwoke wee daa, ọ bụrụ ọnwụ.

O kwuru na onye ahụ na-anyà ụgbọala gwongworo ahụ nà mmadụ abụọ o bu n'ụgbọala ahụ matùrù, gbahapụ ụgbọala ha, ma rie mbọmbọ ọsọ ozigbo ihe mberede okporoụzọ ahụ mèrè.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kasiri ezinụlọ ndị ahụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ abụọ ahụ obi, ma kpekwazie ka mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ zuo ike na ndokwa.

O jikwazị̀ òhère ahụ dọọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị ka ha zèére ịgba oke ọsọ, maka na óké ọsọ na-egbukwa egbu ma na-egbukwa ọsọsọ. Ọ gwàkwàrà ndị na-anyà ọgbatumtum na Keke ka ha zèére ịgba n'okporoụzọ awaraawara ebe a machiri ha ịgba na steeti ahụ, n'ihi na nke ahụ maka ọdịmma na nchekwa ha.