N'Anambra, mmadụ 42 agbanahịla ọnwụ ha n'ihe mberede okporoụzọ

Feb 7, 2023 - 14:03
 0
N'Anambra, mmadụ 42 agbanahịla ọnwụ ha n'ihe mberede okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ iri anọ na abụọ nọrọ na nsonso a wee gbanahị ọnwụ mberede ha steeti Anambra, n'ajọ ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ.

Ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke mere na mpaghara Umuokpu dị na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti nnukwu ụgbọala Mack tipa (enweghị ákàrà) nà ụgbọala bọọsụ̀ ụmụakwụkwọ (nwéré ákàrà ENU355 UJ).

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Roads Safety Commission (FRSC) na steeti Anambra, bụ RC Margaret Onabe siri kọwaa, ihe mberede ahụ metụtara ụmụnwaanyị iri abụọ na anọ na ụmụnwoke iri na asatọ, ebe mmadụ iri atọ na iteghete n'ime ha nwetere mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche.

O kwukwàrà na ndị ọrụ FRSC sitere mpaghara RS5.3 buuru ndị ahụ gaa ụlọ ahụike Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n'Awka maka inye ha ọgwụgwọ. Ọ sịkwa na ndị ọrụ FRSC ahụ nyèkwàzị̀rị̀ aka bughasịa ụgbọala ndị ahụ dachisiri ụzọ, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

Banyere ihe kpatara ya bụ ihe mberede okporoụzọ, RC Onabe mèrè ka a mara na ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na ọ bụ ịgba oke ọsọ mèrè ya bụ ihe mberede okporoụzọ jiri dapụta. Ọ sị na ha kọwàrà na onye ahụ na-anya nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ nà-àgbá oke ọsọ, nke mezịrị ka o jirikwa ọsọ ahụ wee si n'azụ suo ụgbọala bọọsụ̀ ahụ ebe ọ na-agara onwe ya, bọọsụ̀ ahụ wee ghaa ègèdè.

Ọ gàkwàrà n'ihu kwuo na o nweghị onye ọbụla tụfuru ndụ ya n'ihe mberede okporoụzọ ahụ, n'agbànyèghị̀ ka o siri mee na otu ụgbọala ahụ siri daa.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti ahụ, bụ CC Adeoye Irelewuyi kwùrù na ịgba ike ọsọ so n'otu ihe na-ewètakarị ihe mberede okporoụzọ, nke ọtụtụ mmadụ sitegoro na ya wee tụfuo ndụ ha ma gbukwaa ndị ọzọ na-agara onwe ha n'okporoụzọ.

Ọ kpọkukwara ma dọọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ maọbụ ime ihe ndị ọzọ megidere iwu na-achị okporoụzọ, ọkachasị n'ime afọ ọhụrụ a, ọbụna dịka o kpere ka ndị nke ahụ nwetara mmerụahụ gbakerechaa ma nweta ọgwụgwọ zuru oke n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484