N'Anambra, Mmadụ 2 Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

N'Anambra, Mmadụ 2 Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Opekata mpe, mmadụ iri agbanahịla ọnwụ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ tụfuru ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ mere na steeti Anambra ụbọchị ụka gara.

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ije awele, bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC), ngalaba steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi mere ka a mara nke a n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ ahụ, bụ RC Margaret B. Onabe.

Dịka o siri kwuo, ihe mberede a mere n'ogologo okporoụzọ ahụ siri  Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti ụgbọala abụọ, nke gụnyere nnukwu ụgbọala gwongworo Mack (nwéré ákàrà FKJ22XJ) na ụgbọala Toyota Hiace (nwéré ákàrà GDD68ZP).

O kwukwàrà na ihe kpatara ihe mberede a bụ iji ihe dochie okporoụzọ nà ịgba oke ọsọ; ma kọwakwa na ihe mberede a mere n'ihe dịka oge ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere iteghete nke abalị ụbọchị ụka.

Banyere etu ihe mberede okporoụzọ ahụ siri mee, ọ kọwàrà nà ndị ọnọmgbeomere kwùrù na nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ mebiri, nke mezịrị ka onye nwe ya kwụba ya n'akụkụ okporoụzọ ahụ ma gbaghaa ya ebe ahụ jewara. Ọ sị na ha kwukwàrà na onye nke na-anya ụgbọala bọọsụ̀ nọ n'óké ọsọ, wee gbagide, wee jirikwa oke ọsọ ahụ gbakwunyéré ma suo nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ ebe ọ kwụụrụ onwe ya, we kpọrikọọ.

Ọ gàkwàrà n'ihu kwuo na ihe mberede ahụ metụtara mmadụ iri na abụọ, nke gụnyere  ụmụnwoke asatọ na ụmụnwaanyị anọ, ma sịkwa na mmadụ abụọ (bụ ụmụnwoke abụọ) nwụ̀rụ̀ ozigbo ahụ, ebe mmadụ ise nwetara mmerụahụ n'ụdị dị icheiche.

Ọ sị na e bujekwara ndị nke ahụ nwetara mmerụahụ n'ụlọ ahụike, ebe a dọnyekwara ozu ndị nke ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu New Word Mortuary, dị na Nteje.

CC Irelewuyi kpekwàzị̀rị̀ ka mkpụrụobi ndị nke ahụ nwụrụ anwụ zuo ike na ndọkwa, kpee ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere oge adịghị anya; ọbụladị dịka ọ dọrọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị ka ha zèére ịgba oke ọsọ, maka na óké ọsọ na-egbukwa egbu ma na-egbukwa ọsọsọ.